Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 46

Jehova Bụ Eze Anyị!

Jehova Bụ Eze Anyị!

(Abụ Ọma 97:⁠1)

1. Ṅụrịa, nye Jehova otuto;

El’igwe n’akọsa ezi omume ya.

K’anyị jir’ọṅụ bụkuo Chineke abụ,

Chebar’oké ọrụ y’echiche.

(KORỌS)

K’el’igwe ṅụrị’ọṅụ, K’ụwa nwee aṅụrị,

N’ihi na Jehova bụ Eze!

K’el’igwe ṅụrị’ọṅụ, K’ụwa nwee aṅụrị,

N’ihi na Jehova bụ Eze!

2. Kọsaa ebube ya n’ụwa dum;

N’akọsa nzọpụta ya kw’ụbọchị.

Jehova bụ Eze; E kwesịr’ito ya.

Anyị g’akpọrọ ya isiala.

(KORỌS)

K’el’igwe ṅụrị’ọṅụ, K’ụwa nwee aṅụrị,

N’ihi na Jehova bụ Eze!

K’el’igwe ṅụrị’ọṅụ, K’ụwa nwee aṅụrị,

N’ihi na Jehova bụ Eze!

3. Ọchịchị ya amalitela.

Ọkpar’o tere ’manụ nọ n’och’eze.

K’ihere mee chi ndị dị n’ụwa, ka ha daa,

N’ihi na naanị Jaa k’a g’eto.

(KORỌS)

K’el’igwe ṅụrị’ọṅụ, K’ụwa nwee aṅụrị,

N’ihi na Jehova bụ Eze!

K’el’igwe ṅụrị’ọṅụ, K’ụwa nwee aṅụrị,

N’ihi na Jehova bụ Eze!