Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 115

Ime Ka Ụzọ Anyị Gaa nke Ọma

Ime Ka Ụzọ Anyị Gaa nke Ọma

(Jọshụa 1:⁠8)

1. Okwu Jehova dị anyị ụtọ.

N’agụ ya kw’ụbọchị.

Chee echiche n’ihe ị gụrụ;

N’erubekwa isi.

K’o duzie nz’ụkwụ anyị,

Na okwu ọnụ anyị.

(KORỌS)

Gụọ, tụgharị’uche, meekwa ya.

Jaa g’agọzikwa gị.

So ya n’eje ije kw’ụbọchị.

K’ihe gaziere gị.

2. N’oge ọchịchị ndị eze Izrel,

E nyere h’iwu, sị:

‘Ez’ọ bụla g’eji aka ya

Dee Iwu Chineke,

N’agụ ya n’ụbọchị niile,

K’ọ ghara imehie.’

(KORỌS)

Gụọ, tụgharị’uche, meekwa ya.

Jaa g’agọzikwa gị.

So ya n’eje ije kw’ụbọchị.

K’ihe gaziere gị.

3. Anyị gụọ Baịbụl kw’ụbọchị,

A’yị g’enw’olil’anya.

Obi g’erukw’anyị ala,

A’yị g’enw’ezi okwukwe.

Anyị nabata Okwu ya,

Anyị g’etozu okè.

(KORỌS)

Gụọ, tụgharị’uche, meekwa ya.

Jaa g’agọzikwa gị.

So ya n’eje ije kw’ụbọchị.

K’ihe gaziere gị.