Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 48

Soro Jehova Na-eje Ije Kwa Ụbọchị

Soro Jehova Na-eje Ije Kwa Ụbọchị

(Maịka 6:⁠8)

1. Anyị g’eji obi umeala

Soro Nn’anyị je’ije kw’ụbọchị.

Ọ n’emere ndị n’achọ ya

Obiọma n’ekwesịghị ha!

Chineke meer’anyị ndokwa

K’anyị na ya n’eje ije.

Anyị raar’onw’anyị nye ya;

A’yị ga n’akwado Jehova.

2. N’oge a a n’ekpe ụw’ikpe,

K’ọgwụgw’ụw’ọjọọ nke a n’eru,

Mmegide nwer’ik’ime

K’anyị daa mbà n’ihi egwu.

Ma Jehova n’echebe anyị;

Anyị chọr’ịnọ ya nso

K’anyị fee ya ru’ebigh’ebi.

Hụ ya n’anya mgbe niile.

3. Chineke n’enyer’anyị aka

Site ná ’mụọ ya na Okwu ya,

Site n’ọgbakọ Ndị Kraịst,

Na ekper’anyị nke ọ n’aza.

Anyị soro Jaa n’eje ije,

Ọ g’enyer’anyị aka,

K’anyị mụta obiọma ya,

Ma dị obi umeala n’ihu ya.