Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 49

Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị

Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị

(Abụ Ọma 91)

1. Jaa bụ ebe mgbab’anyị.

Ọ bụ ob’ike anyị.

Ndò ya n’echebe anyị;

A’yị g’anọ n’ime ya.

Anyị dabeere n’ike ya

N’ihi n’ọ g’echebe anyị.

Jehova bụ ike anyị,

Ọ n’echebe ndị ezi omume.

2. Ọtụtụ puku g’ada

N’akụkụ eb’ị nọ,

Ọ dịgh’ihe g’eme gị

N’etiti ndị ohu Jaa.

Ị gaghịkwa atụ egwu

Na mbibi g’abịakwasị gị.

Ị g’eji anya gị hụ ya,

Nku Jaa g’echebekwa gị.

3. Chineke g’echebe gị

N’ọnyà dị n’ụzọ gị,

Ị gaghị ada mbà

N’ihi ịtụ egwu.

Ị gagh’atụ egwu ọdụm;

Ị g’azọkwasị agwọ ụkwụ.

Jaa bụ ebe mgbab’anyị,

Ọ n’echebe anyị mgbe niile.