Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 73

Nweenụ Ịhụnanya Siri Ike Site n’Obi Unu

Nweenụ Ịhụnanya Siri Ike Site n’Obi Unu

(1 Pita 1:⁠22)

1. Anyị g’enwe ịhụnanya

Nke n’esi n’al’al’obi;

Ọ g’eme ka ụmụnn’anyị

Dịrị anyị n’obi.

Anyị ga n’achọkwa ụzọ

Anyị g’esi nyere h’aka,

Ṅomie obiọma Chineke,

Gosi ịhụnanya.

K’anyị nwe’ezi ’hụnanya,

N’enyere ndị dar’ogbeny’aka,

Jiri oge ọ bụla

N’eme ihe ndị dị mma.

K’anyị sọpụrụ ’madụ dum;

Ha ga n’adị anyị n’obi.

K’anyị die mmejọ ụmụnna.

Anyị ga n’erub’isi,

N’adị n’otu mgbe niile.

2. Ịhụnany’anyị sie ike,

Anyị agaghị ew’iwe ọkụ;

Anyị kwesịr’ịtụkwasị

Ụmụnn’anyị obi.

Anyị g’abụ ezi enyi ha,

N’ahụ ụmụnn’anyị n’anya.

A’yị n’eji ọṅụ ezukọta

Ka a gbaa anyị ume.

A’yị n’emejọ kw’ụbọchị;

Okwu ọjọọ n’akpasu iwe.

Ndị Jaa hụrụ n’anya,

K’anyị hụkwa ha n’anya.

A’yị g’abụ ezi enyi mgbe dum,

Mee k’ịhụnany’anyị si’ike.

Ka e jiri ya mara gị.

Ṅomie ịhụnanya Jaa,

Ma n’enye ya otuto.