Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 51

Anyị Na-arapara Jehova n’Ahụ́

Anyị Na-arapara Jehova n’Ahụ́

(Jọshụa 23:⁠8)

1. Ọkaakaa, Jehova, kwesịr’otuto niile.

Ọ n’ekp’ikpe zir’ezi n’ihe niil’ọ n’eme.

Ọ dịghị okwu ya g’abụ ihe efu.

A’yị nọ Jehova nso, rapara ya n’ahụ́;

Ịnabat’ọchịchị ya g’abar’anyị uru.

2. Eziokwu n’ez’ikpe bụ ntọala och’eze ya.

Ebe obibi ya jupụtara n’ebube.

Ndị dị umeala n’az’òkù ọ kpọrọ ha.

Anyị n’arapar’Onye kach’elu n’ahụ́;

Ọ bụ naanị ya k’anyị kwesịrị ife.

3. El’igwe nk’el’igwe enwegh’ike ịba ya.

Ọ dịgh’ony’iro g’emeri m’ọ bụ gbochie ya.

Obi sir’any’ike n’ọ g’emezu nkwa ya.

Anyị chọrọ ime uche Chinek’anyị,

K’anyị jir’obi anyị niile hụ ya n’anya.