Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 52

Chebe Obi Gị

Chebe Obi Gị

(Ilu 4:⁠23)

1. Cheb’obi gị, ọ bụ ndụ gị;

Zer’ime mmehie.

Chineke n’enyocha obi

Na ihe ’madụ bụ.

Obi n’esi ọnwụ mgb’ụfọdụ,

Ọ pụr’iduhi’anyị.

Jir’uche gị duzi’obi gị,

N’edebe iwu Jaa.

2. Kwadeb’obi gị ịchọ Jaa

Site n’ikp’ekpere.

N’eto ya ma n’ekele ya;

N’akọrọ ya mkpa gị.

Ihe Jehova n’ezi anyị

Bụ ihe anyị g’eme.

Mụt’ikwesị ntụkwasị obi,

N’em’ihe dị ya mma.

3. Cheb’obi gị, hapụ ih’ọjọọ;

N’eche ihe bụ́ eziokwu.

Ka Okwu Jaa ruo gị n’obi,

Meekwa ka ị d’ike.

Jaa hụrụ ndị ya n’anya;

Ọ n’enye anyị ob’ike.

Jir’obi gị niile fee ya

Ruo mgb’ebigh’ebi.