Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 102

Soro Bụọ Abụ Alaeze!

Soro Bụọ Abụ Alaeze!

(Abụ Ọma 98:⁠1)

1. Nke a bụ abụ mmeri n’abụ ọṅụ;

E ji y’eto Onye ahụ kach’elu.

Ọ n’enye ’madụ niile olil’anya.

Bịa sor’anyị bụọ abụ Al’eze a:

(KORỌS)

‘Fee Jaa n’ihu Och’eze ya.

K’anyị kwusaa: “Nwa ya bụ Eze”!

Bịa mụọ abụ a, ọ bụ abụ Al’eze;

Fee Chineke, tookwa aha nsọ ya.’

2. Abụ a k’anyị ji n’ekwusa Al’eze.

Jizọs n’achị; ọ bụ ya g’achị ụwa.

A mụọla mba e buru amụma ya:

Ha g’eso Jizọs chịa n’Al’eze ya:

(KORỌS)

‘Fee Jaa n’ihu Och’eze ya.

K’anyị kwusaa: “Nwa ya bụ Eze”!

Bịa mụọ abụ a, ọ bụ abụ Al’eze;

Fee Chineke, tookwa aha nsọ ya.’

3. Ndị umeala g’amụta abụ Al’eze a.

O dor’anya, ozi ya n’enye ọṅụ.

Ìgwè mmadụ n’abụ ya n’ụwa niile,

Ha n’akpọkwa ndị ọzọ ka ha bịa:

(KORỌS)

‘Fee Jaa n’ihu Och’eze ya.

K’anyị kwusaa: “Nwa ya bụ Eze”!

Bịa mụọ abụ a, ọ bụ abụ Al’eze;

Fee Chineke, tookwa aha nsọ ya.’