Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 70

“Chọpụta Ihe Ndị Ka Mkpa”

“Chọpụta Ihe Ndị Ka Mkpa”

(Ndị Filipaị 1:⁠10)

1. Taa, a’yị kwesịr’inwe nghọta, k’anyị

Mat’ihe ndị bụ́ eziokwu,

K’anyị matakwa ihe ndị ka mkpa

N’ihe a’yị kwesịr’ime!

N’em’ez’ihe; Hapụ ih’ọjọọ,

Ka Jaa ṅụrịa;

Ị g’enwet’ọṅụ dị ukwuu. Kpe’ekpere;

N’amụ ihe.

K’anyị n’em’ihe ndị a dị mkpa.

2. E nweghị ihe dị mkpa karịa

Izi ozi ọm’Al’eze,

Ịchọta ụmụ atụrụ Nn’anyị, mee

Ka ha soro ụzọ ya.

A’yị g’agwa ha, Ka ha wee nụ.

K’anyị hụ ndị

Agbat’obi n’anya, ka ha ghọta.

Napụta ha!

Ikwus’ozi ọma dị oké mkpa.

3. Okwukw’anyị g’esi ike m’anyị

N’eme ihe ndị dị mkpa.

A’yị g’enw’udo karịr’uche mmadụ,

Nweekwa ezi olil’anya.

Anyị g’enwe ezi ndị enyi

Na ịhụnanya.

Ọ bụ ezi ngọzi m’anyị mụta,

M’anyị ghọta,

N’emekwa ihe ndị dị mkpa!