Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 25

Ihe E Ji Ama Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

Ihe E Ji Ama Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Jọn 13:​34, 35)

1. A’yị chọọ ịbụ Ndị Kraịst n’ezie,

Ọ dị iwu a’yị g’edebe.

Ọ bụ iwu Ez’anyị nyere;

Ọ bụ otú anyị si eṅomi Kraịst.

Ọ bụ ịhụnanya Kraịst nwere;

O ji ndụ ya chụọ àjà,

Gosi anyị ihe nler’anya;

A’yị bụ ndị n’eso ụzọ ya.

2. Ezigbo ịhụnanya g’eme

K’anyị nyere ndị ọzọ aka.

Ịhụnanya b’ụgwọ anyị ji,

A’yị n’eje ozi kw’ụbọchị.

Ọ dịgh’ebe ọzọ a g’ahụ

Ndị nwer’ụd’ịhụnanya a,

Ndị enyi anyị tụkwasịr’obi;

K’anyị sor’ụzọ ịhụnanya.