Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 107

Bịa n’Ugwu Jehova

Bịa n’Ugwu Jehova

(Aịzaya 2:​2-⁠4)

1. Leli’anya, hụ ugwu

Nke kach’ugwu niile.

Ọ bụ Ugwu Jehova.

Ọ dị elu n’oge anyị a.

Ndị si ebe dị anya,

N’akụkụ niile n’ụwa,

N’abịa, n’akpọ ndị ọzọ, sị:

‘Bịanụ fee Chineke.’

Ọ b’ugbu a k’onye nta

G’aghọ mba ukwu Chineke.

Ka anyị n’amụba,

Jaa ga n’edu ma n’agọzi anyị.

Ìgwè ’madụ n’abịa,

Ma n’efe Chinek’anyị.

H’agagh’ahapụ ya.

Ọ bụ nkwa ha kwere ya.

2. Jizọs nyer’any’iwu

Ikwus’okwu Chineke.

A n’ezi ’madụ niile

Ozi ọma Al’eze.

Kraịst nọ n’elu n’achị,

N’asị ndị dum soro ya.

Ndị gere ya ntị

N’eso nduzi Baịbụl.

Ọ n’enye anyị ọṅụ

Ịhụ ok’ìgwè ’madụ n’amụba!

A’yị niile so n’eme

Ka ndị ọzọ mara Jehova.

K’anyị wer’oké olu

N’agwa ’madụ niile, sị,

‘Bịa n’ugwu Jehova,

Nọruo mgb’ebigh’ebi.’