Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 88

Ụmụ Bụ Ihe Nketa Si n’Aka Chineke

Ụmụ Bụ Ihe Nketa Si n’Aka Chineke

(Abụ Ọma 127:​3-⁠5)

1. Mgbe nwoke ghọrọ nna,

Mgbe nwunye ya mụtaara ya nwa,

Ha g’echeta n’e nyela h’ihe

N’abụghị nke naanị ha.

Ọ bụ Jaa nyere h’onyiny’ahụ;

Ọ bụ ya n’enye ndụ na ịhụnanya.

Ọ n’eduzi ndị nne na nna

Ka ha soro ụzọ kacha mma.

(KORỌS)

O nyer’unu onyinye dị nsọ,

Nk’unu ga n’elekọta.

Ih’ọma ị g’emere nwa gị

Bụ izi y’iwu Chineke.

2. Iwu dum Chineke nyere

Ga n’adị n’obi unu mgbe niile.

Unu ga n’ezi ya ụm’unu;

Ọ bụ ọrụ dịịrị unu.

N’ezi ha ya mgb’unu nọ n’ụzọ,

Mgb’unu n’ezu ike m’ọ bụ bilie.

N’ọdịnihu, ka ha cheta ya,

Ka ha n’eme ya, k’a gọzie ha.

(KORỌS)

O nyer’unu onyinye dị nsọ,

Nk’unu ga n’elekọta.

Ih’ọma ị g’emere nwa gị

Bụ izi y’iwu Chineke.