Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 68

Ekpere nke Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya

Ekpere nke Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya

(Abụ Ọma 4:⁠1)

1. Jehova, m n’akpọku gị, n’asị:

“Nụr’ekpere m.”

Nsogbu m dị ukwuu;

ibu m adịghịkwa mfe.

Ike agwụla m n’ihi nchegbu na

obi ịda mbà.

Chineke nkasi obi, lekọta m,

meere m amara.

(KORỌS)

Mee ka m bilie; ka m tachi’obi.

M nwe’obi abụọ, nye m ob’ike.

Naanị gị bụ olil’anya m.

Jaa Jehova, mee ka m d’ike.

2. Okwu gị n’akasi m obi mgbe

ike gwụrụ m,

Ọ n’ekwu obi m mgbe m

n’enwegh’ike ikwu ya.

Biko, k’Okwu gị nye m okwukwe

na ntụkwasị obi.

Mee ka m ghọta n’ịhụnanya

gị karịrị obi m.

(KORỌS)

Mee ka m bilie; ka m tachi’obi.

M nwe’obi abụọ, nye m ob’ike.

Naanị gị bụ olil’anya m.

Jaa Jehova, mee ka m d’ike.