Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 81

“Nyekwuo Anyị Okwukwe”

“Nyekwuo Anyị Okwukwe”

(Luk 17:⁠5)

1. Jehova, ọchịch’obi anyị jọrọ njọ

N’ihi n’anyị bụ ndị n’ezugh’okè.

Chinek’anyị, enwegh’okwukwe na gị

Bụ mmehie n’amat’anyị n’ọnyà.

(KORỌS)

Nna, biko, nyekwuo anyị okwukwe.

Nyer’anyị aka gboor’anyị mkp’anyị.

Mee ebere, nyekwu’anyị okwukwe, k’anyị

Sọpụrụ gị n’okwu na n’omume.

2. E wepụ okwukwe, a pụgh’im’uche gị.

Ị g’akwụ anyị ụgwọ mak’okwukw’anyị.

Okwukw’anyị bụ ọta nke n’echebe anyị

Anyị anaghị at’ụj’ọdịnihu.

(KORỌS)

Nna, biko, nyekwuo anyị okwukwe.

Nyer’anyị aka gboor’anyị mkp’anyị.

Mee ebere, nyekwu’anyị okwukwe, k’anyị

Sọpụrụ gị n’okwu na n’omume.