Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 85

Ụgwọ Ọrụ Zuru Ezu Jehova Na-akwụ

Ụgwọ Ọrụ Zuru Ezu Jehova Na-akwụ

(Matiu 19:⁠29)

1. Jehova, ony’eziokwu, maara nk’ọma

Ndị ji obi dum n’efe ya.

Ọ maara na ofufe ya pụr’ime

Ka ha hapụ ih’ụfọdụ.

Ị hapụ ndị enyi m’ọ bụ ezinụlọ gị,

Jaa ma ihe niil’ị hapụrụ.

O nyere gị ụmụnna hụrụ gị n’anya,

Ị g’ebi n’ụw’ọhụrụ ya.

(KORỌS)

Ka Jehova, Chi nkasi obi, hụ gị;

Ka ọ kwụọ gị ụgw’ọrụ zur’ezu.

Ka nku ya bụr’ebe mgbaba gị.

Jehova Chineke bụ onye eziokwu.

2. Ụfọdụ alụghị di m’ọ bụ nwunye

N’ihi mkpebi m’ọ bụ nsogbu.

Ha bu ’zọ n’achọ Al’eze Chineke,

Ife Jaa n’abara h’uru.

N’ihi na h’alụghị di m’ọ bụ nwunye,

Owu n’ama ha mgb’ụfọdụ.

Eb’ọ bụ n’anyị na ha bụ ụmụnna,

Anyị ga n’enyere h’aka.

(KORỌS)

Ka Jehova, Chi nkasi obi, hụ gị;

Ka ọ kwụọ gị ụgw’ọrụ zur’ezu.

Ka nku ya bụr’ebe mgbaba gị.

Jehova Chineke bụ onye eziokwu.