Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 127

Ebe A Kpọkwasịrị Aha Gị

Ebe A Kpọkwasịrị Aha Gị

(1 Ihe E Mere 29:⁠16)

1. Jehova, ọ bụụr’any’ih’ùgwù

Iwuru aha gị ụlọ!

Anyị ji ọṅụ n’enyefe gị ya,

K’a mara gị, nye gị otuto.

Ih’ọ bụla anyị nyere gị,

Ọ bụ gị nyer’anyị ha dum.

Anyị ji obi anyị dum n’enye gị

Ihe niile anyị nwere.

(KORỌS)

Anyị n’enyefe gị ụlọ a,

K’a mar’aha gị n’ebe a.

A’yị n’arara ụlọ a nye gị;

Biko, k’ọ bụrụ nke gị.

2. Nna, k’anyị n’asọpụrụ gị,

Nọrọkwa n’ebe a n’eto gị.

K’ọtụtụ ndị n’amụt’ụzọ gị

Mee ka otuto dịrị gị.

Anyị g’anọ n’ebe a n’efe gị,

N’elekọtakwa ya nk’ọma.

K’ọ n’agbakw’àmà mgbe niile,

N’akwadokwa ozi ọm’anyị.

(KORỌS)

Anyị n’enyefe gị ụlọ a,

K’a mar’aha gị n’ebe a.

A’yị n’arara ụlọ a nye gị;

Biko, k’ọ bụrụ nke gị.