Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 120

Gee Ntị, Rube Isi, Ka A Gọzie Gị

Gee Ntị, Rube Isi, Ka A Gọzie Gị

(Luk 11:⁠28)

1. K’anyị n’egosi n’anyị n’anụ okwu Kraịst.

Ozizi ya bụ ìhè n’ezi anyị ụzọ.

Obi dị anyị ụtọ ịnụ ma ghọta ya.

Jaa g’agọzi anyị m’anyị rub’isi.

(KORỌS)

A gwa gị uche Chineke,

Rub’isi, k’a gọzie gị.

Ị chọọ inwe ọṅụ, baa n’izu ike ya,

Rub’isi, k’a gọzie gị.

2. Otú anyị si n’ebi ndụ g’echeb’anyị

M’ọ dị k’ụlọ a rụrụ n’elu nkume.

Anyị sor’ezi nduzi Jizọs nyere,

Ndụ anyị g’akwụs’ike ka nkume.

(KORỌS)

A gwa gị uche Chineke,

Rub’isi, k’a gọzie gị.

Ị chọọ inwe ọṅụ, baa n’izu ike ya,

Rub’isi, k’a gọzie gị.

3. Dị k’osisi nke dị n’akụkụ ’miri

N’amị mkpụrụ mgb’oge ya ruru,

Chineke g’eny’anyị ndụ ebigh’ebi,

M’anyị rubere y’isi dị k’ụmụ.

(KORỌS)

A gwa gị uche Chineke,

Rub’isi, k’a gọzie gị.

Ị chọọ inwe ọṅụ, baa n’izu ike ya,

Rub’isi, k’a gọzie gị.