Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 90

Isi Awọ́ Mara Mma

Isi Awọ́ Mara Mma

(Ilu 16:⁠31)

1. Anyị nwere ndị agadi,

H’abụgh’ụmụaka.

Ha n’enwe ihe is’ike,

Ma ha n’edi ya.

Ụfọdụ nọ naanị ha;

H’enwekwaghị ume.

Nna, mesie h’ob’ike

Ná ndụ ọdịnihu.

(KORỌS)

Nna, ị n’echeta

Okwukwe ha dum.

Mee k’obi sie h’ike;

Gwa ha, ‘I meela!’

2. Isi awọ́ ezi omume

Mara mma dị ukwuu.

Ndị agadi n’efe Jaa

Dị mma n’anya ya.

K’anyị cheta n’ọ dị mgbe

Ha n’eto eto.

Ha jesir’ozi ike

Mgb’ike dị ha.

(KORỌS)

Nna, ị n’echeta

Okwukwe ha dum.

Mee k’obi sie h’ike;

Gwa ha, ‘I meela!’