Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 66

Jiri Mkpụrụ Obi Gị Dum Fee Jehova

Jiri Mkpụrụ Obi Gị Dum Fee Jehova

(Matiu 22:⁠37)

1. Jehova, ị bụ Ọkaakaa.

Ọ bụ gị ka m n’eruber’isi.

Naanị gị ka m kwesịr’ife;

Agaghị m emechu gị ihu.

M n’edeb’iwu gị mgbe niile;

M g’eji ọṅụ mee uche gị.

(KORỌS)

Jehova, i ruru eru;

M g’eji mkpụr’obi m dum fee gị.

2. Nna, ọrụ gị n’eto gị.

El’igwe na ụwa n’eto gị.

M ji ndụ m n’ejere gị ozi;

M g’ej’ike m dum kwusa’aha gị.

M g’agbalị imezu nkwa m,

Ijere gị ozi mgbe niile.

(KORỌS)

Jehova, i ruru eru;

M g’eji mkpụr’obi m dum fee gị.