Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 93

‘Mee Ka Ìhè Gị Na-enwu’

‘Mee Ka Ìhè Gị Na-enwu’

(Matiu 5:⁠16)

1. Jizọs sịr’anyị mee K’ìhè anyị n’enwu,

K’anyị ghar’ịkp’ókè, Ka ndị dum h’ụzọ.

Baịbụl n’eme k’anyị Nwet’amamihe.

K’anyị si n’ezi ọrụ anyị N’enwu ìhè ya.

2. Ozi Al’eze n’eme Ka ’madụ hụ ìhè,

N’enye nkasi obi Na olil’anya.

Baịbụl n’eduzi anyị Ime uche Jaa;

Okwu ọma nke dị ụtọ N’eme k’ìhè nwuo.

3. Ezi ọrụ anyị n’arụ N’eny’ụwa ìhè,

Mee k’okwu anyị maa mma Dị k’ezigbo akụ̀.

K’anyị n’em’ez’ihe, K’ìhè anyị n’enwu,

Ọrụ anyị ga n’atọ Jaa Ụtọ mgbe niile.