Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 72

Ka Anyị Mụta Ịhụnanya

Ka Anyị Mụta Ịhụnanya

(1 Ndị Kọrịnt 13:⁠1-8)

1. A’yị n’ekpeku Chinek’ekpere,

K’anyị mụta àgwà ya niile.

M’ịhụnanya kacha na ha dum.

A’yị n’enwe ya site na ’mụọ ya.

Amamihe anyị bụ ih’efu

M’anyị enweghị ịhụnanya.

K’anyị mụta ezi ’hụnanya,

Tachie obi, mee ka Jaa ṅụrịa.

2. Ọ bụghị naanị uche anyị

K’anyị g’eji n’ezi atụrụ ihe.

K’anyị hụ ha n’anya n’eziokwu,

Jir’Okwu Chineke n’azụ ha.

A’yị nwee ịhụnanya sir’ike,

A’yị g’ed’ihe ọjọọ na nsogbu.

Mgbe nsogbu bịara, cheta na

Ịhụnanya n’ed’ihe niile.