Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 132

Abụ Mmeri

Abụ Mmeri

(Ọpụpụ 15:⁠1)

1. Bụkuo Jaa abụ. E buliwo aha ukwu y’elu.

Ọ tụbara nd’iro ya N’oké osimiri.

Toonụ Jehova; Naanị ya pụr’im’ihe niile.

Jehova bụ aha ya; O nweela ezi mmeri.

(KORỌS)

Jehova, bụ́ Onye Kach’elu,

Onye n’adịghị agbanwe agbanwe,

Ị g’ebibi nd’iro gị n’isi nso,

Ma mee ka aha gị dị nsọ.

2. Lee ka mba niile N’emegide Jehova, bụ́ Eze.

Ha d’ike karịa Fero, M’ihere g’eme ha.

A g’ebibi ha; Ha niile g’anwụ n’Amagedọn.

’Madụ niile g’ama Na Jehova bụ aha ya.

(KORỌS)

Jehova, bụ́ Onye Kach’elu,

Onye n’adịghị agbanwe agbanwe,

Ị g’ebibi nd’iro gị n’isi nso,

Ma mee ka aha gị dị nsọ.