Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 76

Jehova, Chineke nke Udo

Jehova, Chineke nke Udo

(Ndị Filipaị 4:⁠9)

1. Jehova, Chi udo,

Chi nke ezi ’hụnanya,

Nye anyị udo na ọnọdụ ọma,

K’anyị mịkwu’ezi mkpụrụ.

A’yị n’achọ nduzi gị;

Nwa gị zụtara ndụ anyị.

Biko, nye anyị udo gị nke

Karịr’echiche niile.

2. Ụw’agagh’ah’udo.

Ha j’isi kote nsogbu.

Udo n’ezoro ndị gị

Dị ka ’miri ozuzo.

Biko, nyekwu’anyị udo,

Ma gọzie mgbalị anyị

K’anyị n’aghọta uche gị

Ma n’emezu nkw’anyị.

3. Okwu gị n’eny’ìhè,

’Mụọ gị n’emegh’any’anyị.

Ha n’edu anyị, n’echeb’anyị

N’ụwa gbar’ọchịchịrị.

K’udo gị nye anyị ume,

Mee k’obi ruo anyị ala,

K’ị n’echebe uche anyị,

N’echebekw’echich’anyị.