Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 94

Ka Ezi Onyinye Chineke Ju Gị Afọ

Ka Ezi Onyinye Chineke Ju Gị Afọ

(Jems 1:⁠17)

1. Onyinye niile zur’okè,

Ihe n’eny’anyị ọṅụ,

Ihe bar’ezi uru ná ndụ,

Si n’aka Chineke.

Ọ nagh’al’azụ n’okwu ya,

Ọ naghị agbanwe.

Jehova n’egbor’anyị mkpa,

N’enye ndụ na ìhè.

2. K’anyị ghar’ichegbu onw’anyị

Banyere mkp’anyị;

Onye n’azụ anụ ufe

N’elekọta anyị.

Anyị anagh’achụ ih’efu

M’ọ bụ esemokwu.

Ihe Jaa n’enye jur’anyị afọ.

N’el’anya n’otu ebe.

3. Oké ihe n’anya mmadụ

Bụ ih’efu n’anya Jaa.

K’anyị jiri ndụ anyị dị ugbu a

Chọọ ihe bar’uru.

Ihe agagh’eme akụ̀ anyị

Dị n’aka Chineke.

A’yị chọr’inwe ezi af’ojuju,

N’el’anya n’otu ebe.