Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 62

Ònye Ka Anyị Bụ nke Ya?

Ònye Ka Anyị Bụ nke Ya?

(Ndị Rom 14:⁠8)

1. Ònye k’ị bụ nke ya?

Olee chi nke ị n’efe?

Ọ bụ ony’ị n’efe bụ nna gị ukwu.

Ọ bụ chi gị; ị n’efe ya.

Ị gagh’efe chi abụọ;

Ị gagh’eji obi gị dum

Hụ nna ukwu abụọ n’anya otu mgbe.

Ị g’emejọ ha abụọ.

2. Ònye k’ị bụ nke ya?

Olee chi nke ị g’efe?

Otu chi ụgha, otu ezi Chi,

Ị g’ahọrọ nk’ị g’efe.

Ọ̀ bụ Siza nk’ụwa a

Ka ị ga n’ef’ofufe?

K’ị̀ g’efe ezi Chineke ugbu a,

N’em’uche ya mgbe niile?

3. Ònye ka m bụ nke ya?

Jaa ka m g’eruber’isi.

M g’efe Nna m nk’el’igwe;

M g’emezu nkwa m niile.

Ọ zụrụ m oké ọnụ;

M ga n’ahụ ya n’anya.

O ji ọnwụ Ọkpara ya gbapụta m;

M g’asọpụr’aha ya.