Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 131

Jehova Na-emere Anyị Ụzọ Mgbapụ

Jehova Na-emere Anyị Ụzọ Mgbapụ

(2 Samuel 22:​1-⁠8)

1. Chinek’anyị, i gosila n’ị dị ndụ;

Anyị n’ahụ ọrụ gị n’el’igwe na n’ụwa.

Ọ dịghị chi ọzọ pụr’ime ihe i meworo.

Ị g’egbu nd’iro anyị.

(KORỌS)

Jehova n’emer’anyị ụzọ mgbapụ.

Ndị ya g’ahụ na ọ bụ Oké Nkume.

A’yị ji ob’ike n’akọ ịdị ukwuu Jaa,

bụ́ Onye n’eme Ụzọ mgbapụ, tụkwasị y’obi, ma to’aha ya.

2. Ụd’ọnwụ agbaala m gburugburu, biko,

“Jehova, nye m ume, biko, nye m ob’ike.”

Ị nọ n’ụlọ nsọ gị nụ ihe m rịọrọ gị, “Chebe m;

Chineke m, napụta m.”

(KORỌS)

Jehova n’emer’anyị ụzọ mgbapụ.

Ndị ya g’ahụ na ọ bụ Oké Nkume.

A’yị ji ob’ike n’akọ ịdị ukwuu Jaa,

bụ́ Onye n’eme Ụzọ mgbapụ, tụkwasị y’obi, ma to’aha ya.

3. Ị g’esi n’elu kwu’okwu, mee k’a nụ olu gị.

Nd’iro g’at’ụjọ; ndị gị g’enw’ọṅụ.

Ị n’aghọ ih’ọ bụla dị mkpa k’ị ghọọ; a’yị g’ahụ

N’ị bụ Onye Nzọpụta.

(KORỌS)

Jehova n’emer’anyị ụzọ mgbapụ.

Ndị ya g’ahụ na ọ bụ Oké Nkume.

A’yị ji ob’ike n’akọ ịdị ukwuu Jaa,

bụ́ Onye n’eme Ụzọ mgbapụ, tụkwasị y’obi, ma to’aha ya.