Abụ nke 58
Ekpere M Ji Rara Onwe M Nye Chineke
1. Wer’obi m k’ọ hụ eziokwu
N’amamihe gị n’anya.
Wer’uche m, Onyenw’anyị,
Ka m jir’obi m dum je’ozi.
2. Wer’ụkwụ m n’aka m abụọ;
Ka ha deb’iwu gị dum.
Wer’olu m ka ọ bụkuo
Eze m abụ mgbe dum.
3. Were ndụ m, Onyenw’anyị,
Mee k’o kwekọọ n’uche gị.
Chineke m, biko, were m
K’omume m n’atọ gị ụtọ.
(Gụọkwa Ọma 40:8; Jọn 8:29; 2 Kọr. 10:5.)