Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 95

‘Detụ Jehova Ire ma Hụ na Ọ Dị Mma’

‘Detụ Jehova Ire ma Hụ na Ọ Dị Mma’

(Abụ Ọma 34:⁠8)

1. Anyị ji ozi Jaa kpọr’ihe;

Ozi ọma dị anyị oké mkpa.

Anyị n’enye Jaa ihe kacha mma,

Ọtụtụ ka g’anụ ozi ọma.

(KORỌS)

Baịbụl n’akpọ anyị: ‘Bịa, detụ ire​—

Hụ na Jehova dị mma.’

Ịsọpụrụ ya bar’ezi uru,

A’yi ji obi dum n’ej’ozi.

2. Ndị nọ n’ozi oge niile

G’enwet’ezi ngọzi n’akụ̀.

Ha ma na Chineke n’egbo mkpa ha,

Afọ n’eju ha n’ihe dum.

(KORỌS)

Baịbụl n’akpọ anyị: ‘Bịa, detụ ire​—

Hụ na Jehova dị mma.’

Ịsọpụrụ ya bar’ezi uru,

A’yi ji obi dum n’ej’ozi.