Abụ nke 124
Nabata Ha nke Ọma
1. Jehova n’anabat’anyị nk’ọma.
Ọ bụ ya n’elekọta ’madụ niile.
Ọ n’eny’anyị niile ’mir’ozuzo n’anwụ,
N’eme k’anyị nwe’ọṅụ na nri.
Mgbe anyị meere ogbenye ih’ọma,
A’yị n’egosi n’anyị b’ụmụ Chineke.
Ọ g’akwụ anyị ụgwọ ih’ọm’anyị mere,
Na obiọm’anyị nke si n’obi.
2. A’yị hụ ndị nọ ná mkpa ma nyere h’aka,
Anyị amagh’ih’ọma ọ g’arụpụta.
Ha nwer’ike ịbụ ndị anyị n’amaghị,
M’anyị n’egboro ha mkpa ha.
A’yị n’ekwu ka Lidia: “Batanụ n’ụlọ m.”
Ha nọrọ n’ụlọ anyị, obi eruo h’ala.
Chineke Nn’anyị n’ahụ ndị niile
N’eṅomi obi ebere ya.