Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 96

Chọpụta Ndị Kwesịrị Ekwesị

Chọpụta Ndị Kwesịrị Ekwesị

(Matiu 10:​11-⁠15)

1. Jizọs zir’otú e si ezi ozi ọma.

O nyer’anyị ntụziaka, sị:

‘Eb’ọ bụl’unu gara, chọsienụ ike

Ndị maara mkpa ime ’mụọ ha.

I kelee ndị nọ n’ụlọ, zie h’ozi udo,

Ndị kwesịrị g’enwe udo.

E nwee ndị jụrụ m’ọ bụ chụpụ gị,

Tichapụ ájá n’ụkwụ gị, lawa.’

2. Ha nabata gị, ha nabatara ya.

Chineke g’emegh’obi ha.

Ebe ha chọr’inweta ndụ ebigh’ebi,

Ha g’eso gị n’efe Chineke.

Echegbul’onwe gị mak’ihe ị g’ekwu,

Jehova g’enyere gị aka.

Okwu gị dịrị n’amara, dịkw’ụtọ,

Ọ g’amasị ndị dị umeala.