Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 57

Ihe M Na-atụgharị n’Uche

Ihe M Na-atụgharị n’Uche

(Abụ Ọma 19:⁠14)

1. K’ihe m n’atụgharị n’uche,

Na ihe m n’eche kw’ụbọchị

N’atọ gị ụtọ, Onyenw’anyị,

Mee ka m nọgide n’ụzọ gị.

Mgbe nchegbu mere k’obi

Ghar’iru m ala n’abalị,

Ka m tụgharịa uche na gị,

Nakwa n’ihe ndị zir’ezi.

2. Ihe bụ́ eziokwu ma dị ọcha,

Omume ọma ọ bụla,

Ihe e kwuru n’ọ dị mma​—⁠

K’iche ihe ndị a nye m udo.

Jaa, echiche gị bar’uru!

A pụgh’ịgụta ya ọnụ.

Ka m tụgharị’uche n’okwu gị,

Tinyekwa obi m dum na ya.