Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 60

Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

(1 Pita 5:⁠10)

1. Ọ d’ihe mere Jaa ji zi gị eziokwu ya,

Mee k’i si n’ọchịchịrị baa n’ìhè.

Ọ hụrụ na ọ n’agụ gị agụụ n’obi

Ịchọ ya na ime ihe zir’ezi.

I kwere ya nkwa im’uche ya;

Ọ g’anọgide n’enyere gị aka.

(KORỌS)

Chineke ji ọbara Kraịst mee k’ị bụrụ nke ya.

Ọ g’eme k’i si’ike, mee k’i guzosi’ike.

Ọ g’edu ma chebe gị, dị k’ọ n’eme kemgbe.

Ọ g’eme k’i si’ike, mee k’i guzosi’ike.

2. Chineke nyere Ọkpara ya n’ihi gị;

Ọ chọrọ k’ihe n’agaziri gị.

Eb’O nyere Ọkpara y’ọ hụrụ n’anya,

K’obi sie g’ike n’ọ g’enye g’ike.

Ọ gaghị echefu okwukwe gị;

Ọ ga n’elekọta ndị ya niile.

(KORỌS)

Chineke ji ọbara Kraịst mee k’ị bụrụ nke ya.

Ọ g’eme k’i si’ike, mee k’i guzosi’ike.

Ọ g’edu ma chebe gị, dị k’ọ n’eme kemgbe.

Ọ g’eme k’i si’ike, mee k’i guzosi’ike.