Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 130

Ndụ Bụ Ọrụ Ebube

Ndụ Bụ Ọrụ Ebube

(Abụ Ọma 36:⁠9)

1. Nw’ọhụr’ọ bụla, na ‘mir’ozuzo,

Ọmarịcha anyanwụ Na mkpụrụ dum​—⁠

Bụ onyinye Jaa N’egosi ụzọ ya.

Ọrụ ebube ya baar’anyị uru kw’ụbọchị.

(KORỌS)

A’yị g’eji onyinye ahụ n’enweghị atụ

Hụ Onye nyere ya n’anya, ma n’ekele ya.

Ihe ọ sọr’anyị mee, O rughịrị anyị.

Ihe a bụ onyinye​—Ndụ bụ ọrụ ebube.

2. Ụfọdụ ndị Pụr’ịda mbà,

Ha n’ekwu ka nwunye Job: ‘Kọchaa Jaa, nwụọ.’

Anyị dị iche. Anyị n’eto Jaa,

A’yị n’ekele ya n’ihi ndụ o nyer’anyị.

(KORỌS)

A’yị g’eji onyinye ahụ n’enweghị atụ

Hụ ’madụ ibe anyị n’anya, n’enyere h’aka.

Ihe ọ sọr’anyị mee, O rughịrị anyị.

Ihe a bụ onyinye​—Ndụ bụ ọrụ ebube.