Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 134

Hụ Onwe Gị Mgbe Ihe Niile Dị Ọhụrụ

Hụ Onwe Gị Mgbe Ihe Niile Dị Ọhụrụ

(Mkpughe 21:​1-⁠5)

1. Hụ onwe gị na mụ onwe m,

K’anyị niile nọ n’ụwa ọhụrụ.

Chee otú obi g’adịkwa gị

Ibi n’udo ma nwer’onwe gị.

Onye ọjọọ agagh’anọ;

Ọchịchị Jaa agaghị ada.

Mgbe ụwa ọhụrụ g’amalite,

Anyị g’eji obi anyị niile bụ’abụ, sị:

(KORỌS)

“Jehova Chinek’anyị, i meela!

Nwa gị mere k’ihe dị ọhụrụ.

Anyị ji obi anyị dum n’abụ abụ; ọ bụ gị

Nw’ebube, nsọpụrụ, n’otuto niile.”

2. Hụ onwe gị na mụ onwe m;

Lepụ anya, hụ ụw’ọhụrụ n’abịa.

A gagh’ahụ ma ọ bụ nụ

Ihe g’eme k’anyị tụọ ụjọ.

Ihe niile emezuola

Dị k’o kwuru; ụlọikwuu ya

Ekpuchiela ụmụ ’madụ; ọ kpọtee

Ndị nwụr’anwụ, ha g’eso kelee ya, sị:

(KORỌS)

“Jehova Chinek’anyị, i meela!

Nwa gị mere k’ihe dị ọhụrụ.

Anyị ji obi anyị dum n’abụ abụ; ọ bụ gị

Nw’ebube, nsọpụrụ, n’otuto niile.”