Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Ezi Onye Nkwusa Alaeze:

Were ya na ị bụ otu n’ime ndịozi Jizọs, ndị guzo n’Ugwu Oliv. Jizọs apụta n’ihu gị. Ozugbo ọ chọrọ ịla eluigwe, ya ekwuo, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Gịnị ka ị ga-eme?

O nwere ike ịdị gị ka ọrụ ahụ ọ̀ karịrị akarị. I nwere ike iche, sị, ‘Olee otú anyị ga-esi gbaa àmà ruo “n’ebe kasị anya n’ụwa” ebe ọ bụ na anyị dị ole na ole?’ I nwere ike icheta ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ. Ọ sịrị ha: “Ohu adịghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu; ọ bụrụ na ha edebewo okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. Ma ha ga-eme unu ihe ndị a niile n’ihi aha m, n’ihi na ha amaghị onye ahụ nke zitere m.” (Jọn 15:20, 21) Ka ị na-echebara okwu ahụ echiche, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị, ‘Olee otú m ga-esi gbaa àmà nke ọma n’agbanyeghị mmegide na mkpagbu dị otú ahụ?’

Taa, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ụdị ajụjụ ndị ahụ. Ọrụ e nyere anyị bụ́ Ndịàmà Jehova bụ ịgbara “ndị mba niile” àmà nke ọma ruo “n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Mat. 28:19, 20) Olee otú anyị ga-esi rụọ ọrụ a, ebe ọ bụkwanụ na e kwuola na a ga-emegide anyị?

Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kọrọ akụkọ ndị magburu onwe ha banyere otú Jehova si nyere ndịozi na Ndị Kraịst ibe ha aka na narị afọ mbụ Oge Anyị ịrụ ọrụ ahụ e nyere ha. E dere akwụkwọ a ị na-agụ ugbu a ka o nyere gị aka n’ịtụle akụkọ ndị ahụ na-atọ ụtọ ma hụ otú ihe ndị a kọrọ na ha si enye obi ụtọ. Ọ ga-eju gị anya ịhụ na e nwere ụzọ dị iche iche ndị ohu Chineke na narị afọ mbụ na ndị nke oge a si yie. Ị ga-ahụ na ọrụ e nyere anyị yiri ọrụ e nyere ha, nakwa na otú e si hazie anyị ịrụ ọrụ ahụ yikwara otú e si hazie ha. O doro anya na ichebara ụzọ ndị a anyị na ha si yie echiche ga-eme ka obi sikwuo gị ike na Jehova Chineke ka na-eduzi nzukọ ya dị n’ụwa.

Anyị na-ekpe ekpere ma nwee olileanya na ịtụle akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ga-eme ka obi sikwuo gị ike na Jehova ga-enyere gị aka nakwa na mmụọ nsọ ya ga na-akwado gị. Ka e si otú ahụ gbaa gị ume ịnọgide ‘na-agba àmà nke ọma’ banyere Alaeze Chineke ma na-enyere ndị ọzọ aka ịbata n’okporo ụzọ ahụ na-eduga ná nzọpụta.—Ọrụ 28:23; 1 Tim. 4:16.

Ụmụnna gị,

Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova