Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 5

Ònye Gere Chineke Ntị n’Oge ahụ E Nwere Iju Mmiri? Ole Ndị Na-egeghị Ya Ntị?

Ònye Gere Chineke Ntị n’Oge ahụ E Nwere Iju Mmiri? Ole Ndị Na-egeghị Ya Ntị?

Ọtụtụ mmadụ mere ihe ọjọọ n’oge Noa. Jenesis 6:5

Adam na Iv mụrụ ụmụ, nke mere ka e nwee ọtụtụ mmadụ n’ụwa. Ka oge na-aga, ụfọdụ ndị mmụọ ozi sooro Setan nupụrụ Chineke isi.

Ha bịara n’ụwa n’ọdịdị mmadụ ka ha nwee ike ịlụ ụmụ nwaanyị. Ndị nwunye ha mụrụ ụmụ ndị pụrụ iche, bụ́ ndị siri ike ma na-eme ihe ike.

N’oge ahụ, ụwa jupụtara ná ndị na-eme ihe ọjọọ. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu n’ụwa . . . , ihe niile obi ya na-eche mgbe niile bụ naanị ihe ọjọọ.”

Noa gere Chineke ntị wee rụọ ụgbọ. Jenesis 6:13, 14, 18, 19, 22

Noa bụ ezigbo mmadụ. Jehova gwara Noa na ya ga-eji iju mmiri bibie ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ.

Chineke gwakwara Noa ka ọ rụọ nnukwu ụgbọ ma kpọba nwunye ya na ụmụ ya nakwa ụdị anụmanụ dị iche iche n’ime ya.

Noa dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere Iju Mmiri ahụ na-abịanụ, ma ha egeghị ya ntị. Ụfọdụ chịrị ya ọchị; ndị ọzọ akpọọ ya asị.

Mgbe Noa rụchara ụgbọ ahụ, ọ chịbara ụmụ anụmanụ n’ime ya.