Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 6

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Iju Mmiri Ahụ?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Iju Mmiri Ahụ?

Chineke bibiri ndị ajọ mmadụ, ma o chebere Noa na ezinụlọ ya. Jenesis 7:11, 12, 23

Mmiri zoro ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị, nke mere ka mmiri kpuchie ụwa niile. Ndị ajọ mmadụ niile nwụrụ.

Ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi yipụrụ ahụ́ mmadụ ha yikwasịrị wee ghọọ ndị mmụọ ọjọọ.

Ndị nọ n’ụgbọ ahụ anwụghị. N’agbanyeghị na Noa na ezinụlọ ya mechara nwụọ, Chineke ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha wee dịrị ndụ ebighị ebi.

N’oge anyị a, Chineke ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ọ ga-echebe ndị na-eme ihe ọma. Matiu 24:37-39

Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ka na-eduhie ndị mmadụ.

Dị ka ndị mmadụ mere n’oge Noa, ọtụtụ ndị taa anaghị ege ntị n’ihe Jehova ji obiọma na-agwa ha ka ha mee. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ndị niile na-eme ihe ọjọọ.—2 Pita 2:5, 6.

E nwere ndị na-eme ka Noa. Ha na-ege Chineke ntị, na-emekwa ihe ọ gwara ha mee. Ha bụ Ndịàmà Jehova.