Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Na-agwa Ndị Mụrụ M Okwu?

Olee Otú M Ga-esi Na-agwa Ndị Mụrụ M Okwu?

ISI NKE 1

Olee Otú M Ga-esi Na-agwa Ndị Mụrụ M Okwu?

“Agbalịsiri m ike ịgwa ndị mụrụ m otú obi dị m, ma okwu agaghị m were were n’ọnụ. Ha napụrụ m okwu n’ọnụ ozugbo. O siiri m ezigbo ike ịkata obi gaa ịgwa ha otú obi dị m, ma mbọ niile m gbara kụrụ afọ n’ala!”—Rosa.

MGBE ị ka dị obere, o nwere ike ịbụ mama gị na papa gị bụ ndị mbụ ị na-agakwuru ka ha gwa gị ihe ị ga-eme mgbe ọ bụla i nwere nsogbu. Ị na-akọrọ ha ihe ọ bụla merenụ, ihe ọ sọkwara ya bụrụ. Ị na-agwa ha otú obi dị gị, obi na-esikwa gị ike na ndụmọdụ ha ga-abara gị uru.

Ma ugbu a, o nwere ike ịdị gị ka ha anaghịzi aghọta gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Edie sịrị: “Mgbe anyị na-eri nri n’otu mgbede, amalitere m ibe ákwá ma na-akọrọ ndị mụrụ m otú obi dị m. Ha gere ntị, ma ọ dị ka ha aghọtaghị ihe m na-ekwu.” Gịnịzi mere? “Abanyere m n’ọnụ ụlọ nke m gaa bee ezigbo ákwá!”

Ma, i nwere ike ikpebi mgbe ụfọdụ na ị gaghị akọrọ ndị mụrụ gị otú obi dị gị. Otu nwata nwoke aha ya bụ Christopher sịrị: “Ana m akọrọ ndị mụrụ m ọtụtụ ihe. Ma obi dị m ụtọ na mgbe ụfọdụ, ha anaghị ama ihe niile m na-eche n’obi m.”

Ọ̀ dị njọ ma ọ bụrụ na ị gwaghị ndị mụrụ gị ihe ụfọdụ ị na-eche? Ọ dịghị njọ ma ọ bụrụhaala na ị naghị eme ya iji ghọgbuo ha. (Ilu 3:32) N’agbanyeghị nke ahụ, ma ọ̀ dị gị ka ndị mụrụ gị anaghị aghọta gị ma ọ̀ bụ na gịnwa anaghị achọ ịkọrọ ha ihe, otu ihe doro anya bụ: I kwesịrị ịna-akọrọ ndị mụrụ gị ihe, ha kwesịkwara ịma ihe dị gị n’obi.

Na-agwa Ha Okwu!

E nwere ike iji ịgwa ndị mụrụ gị okwu tụnyere ịnya ụgbọala. Ọ bụrụ na ị nyara ụgbọala ruo ebe ihe nọchiri ụzọ, ike agaghị agwụ gị; ị ga-achọrọ ụzọ ọzọ gawa ebe ị na-aga. Ka anyị tụlee ihe atụ abụọ.

IHE MGBOCHI NKE 1 Ị chọrọ ịgwa ndị mụrụ gị ihe, ma ọ dị gị ka ha anaghị ege gị ntị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lia sịrị: “Ọ na-esiri m ike ịkọrọ papa m ihe. Mgbe ụfọdụ, m ga-anọ na-akọrọ ya ihe, ihe m ga-anụzi bụ, ‘Ewela iwe, ị̀ sịrị gịnị?’”

AJỤJỤ: Ọ́ bụrụkwanụ na e nwere nsogbu Lia kwesịrị ịkọrọ papa ya? E nwere ihe atọ o nwere ike ime.

Nke A

Iji olu ike gwa papa ya okwu. Lia ejiri olu ike sị papa ya: “Papa, ihe a dị ezigbo mkpa! Geenụ mụ ntị!”

Nke B

Ịkwụsị ịkọrọ papa ya ihe. Lia akwụsị ịkọrọ papa ya nsogbu o nwere.

Nke CH

Ịchọta oge ka mma ọ ga-akọrọ ya nsogbu ahụ. Lia agakwuru papa ya ma kọọrọ ya ihe bụ́ nsogbu ya ma ọ bụ ya edee ya ede nye papa ya.

Olee nke chere Lia kwesịrị ime? ․․․․․

Ka anyị leba anya n’ihe ndị ahụ ma mara uru na ọghọm ndị nwere ike ịdị na nke ọ bụla.

O nwere ihe ọzọ papa Lia na-eche, ọ bụkwa ya mere na ọ chọpụtaghịdị na obi adịghị Lia mma. N’ihi ya, ọ bụrụ na Lia ahọrọ Nke A, papa ya agaghị aghọta ihe mere o ji jiri olu ike na-agwa ya okwu. Ọ bụrụ na Lia ejiri olu ike gwa papa ya okwu, o nwere ike ọ gaghị eme ka papa ya gee ya ntị, ọ gaghịkwa egosi na ọ na-asọpụrụ ya. (Ndị Efesọs 6:2) N’ihi ya, iji olu ike agwa papa ya okwu agaghị abara ya uru.

Ọ bụ eziokwu na ịhọrọ Nke B nwere ike iyi ka ọ̀ kacha mfe, ma ọ bụghị ya kacha mma. Maka gịnị? Maka na “atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu, ma a na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.” (Ilu 15:22) Ọ bụrụ na Lia chọrọ ime ka nsogbu ahụ bie, o kwesịrị ịkọrọ ya papa ya. Ọ bụrụkwa na ọ chọrọ ka papa ya nyere ya aka, papa ya kwesịrị ịmata ihe bụ́ nsogbu ya. Ịkwụsị ịkọrọ papa ya ihe ọ bụla agaghị eme ka nsogbu ahụ bie, ọ gaghịkwa eme ka papa ya nyere ya aka.

Ma, ọ bụrụ na Lia ahọrọ Nke CH, ọ pụtara na o kweghị ka nsogbu ọ bụla gbochie ya ime ihe ọ chọrọ ime. Kama, ọ ga-agbalị ịgwa papa ya ihe ahụ n’oge ọzọ. Ọ bụrụkwa na Lia ekpebie ide ya ede nye papa ya, o nwere ike ime ka obi dị Lia mma. O dee ya ede, ọ ga-enwe ike ide ihe niile ọ chọrọ ikwu. Papa Lia gụọ ihe ahụ o dere, ọ ga-aghọta ihe ọ chọrọ ịgwa ya. O nwekwara ike inyere ya aka ịghọtakwu nsogbu ya. N’ihi ya, nke CH ga-abara Lia na papa ya uru.

Olee ihe ndị ọzọ Lia nwere ike ime? Legodị ma ò nwere nke ị ga-echeta ma dee ya n’okpuru ebe a. Deekwa uru ma ọ bụ ọghọm nwere ike ịdị na ya.

․․․․․

IHE MGBOCHI NKE 2 Ndị mụrụ gị chọrọ ka gị na ha kparịta ụka, ma gịnwa achọghị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sera sịrị: “O nweghị ihe na-ewe m iwe ka mmadụ ịjụkasị m ajụjụ ahụ́ ozugbo m si n’ụlọ akwụkwọ lọta. Naanị ihe m chọrọ mgbe ahụ bụ iwepụ obi m n’ihe ọ bụla gbasara ụlọ akwụkwọ. Ma, ọ bụ mgbe ahụ ka ndị mụrụ m na-amalite ịjụ m: ‘Olee otú ụlọ akwụkwọ si gaa taa? Ì nwere nsogbu n’ụlọ akwụkwọ taa?’” O doro anya na ihe mere papa Sera na mama ya ji na-ajụ ya ajụjụ ndị ahụ bụ na ha na-echere ya echiche ya ọma. Ma Sera sịrị, “Ọ na-esiri m ike ịkọ ihe mere n’ụlọ akwụkwọ mgbe ezigbo ike gwụrụ m.”

AJỤJỤ: Gịnị ka Sera nwere ike ime? Dị ka e kwuru n’ihe atụ mbụ ahụ anyị nyere, e nwere ihe atọ o nwere ike ime.

Nke A

Ịjụ ịza ihe ha jụrụ ya. Sera ekwuo, sị: “Biko, hapụnụ m aka. Achọghị m ikwu ihe ọ bụla ugbu a!”

Nke B

Ịza ha ihe ha jụrụ ya. Sera azaa ha ajụjụ ahụ n’agbanyeghị na ike gwụrụ ya, ma ihe ọ zara ha esighị ya n’obi.

Nke CH

Ịhapụ ikwu ihe ọ bụla gbasara “ụlọ akwụkwọ,” ma kwuo banyere ihe ọzọ. Sera ekwuo na ya ga-akọrọ ha ihe mere n’ụlọ akwụkwọ mgbe obi dị ya mma. Ọ jụziri ha ajụjụ gosiri na ọ hụrụ ha n’anya: “Olee otú ụbọchị taa si gaa? Ọ̀ gakwara nke ọma?”

Olee nke chere Sera kwesịrị ime? ․․․․․

Ka anyị lebakwa anya n’ihe ndị ahụ ma mara uru na ọghọm ndị nwere ike ịdị na nke ọ bụla.

Ike gwụrụ Sera, ọ chọghịkwa ka ya na onye ọ bụla kparịta ụka. Ọ bụrụ na ọ họrọ Nke A, ike ka ga-agwụkwa ya, ma obi ga na-ama ya ikpe n’ihi otú o si jiri iwe gwa ndị mụrụ ya okwu.—Ilu 29:11.

Ihe ọzọ bụ na obi agaghị adị papa Sera na mama ya mma n’ihi otú o si gwa ha okwu ma ọ bụ n’ihi otú ebe niile ga-esi jụọ oyi mgbe o kwuchara ihe ahụ. Ha nwere ike ichewe na e nwere ihe Sera na-ezochiri ha. Ha nwedịrị ike ịgwa ya na ọ ga-azarịrị ha ajụjụ ha, nke ga-eme ka iwe wekwuo ya. N’ihi ya, Nke A agaghị abara ya uru.

O doro anya na Nke B ka Nke A mma. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọ ga-eme ka ya na ndị mụrụ ya kparịta ụka. Ma ebe ọ bụ na ihe ahụ Sera na-ekwu esighị ya n’obi, ya na ndị mụrụ ya agaghị enweta ihe ha chọrọ, ya bụ, ka onye ọ bụla kwuo otú ọ dị ya n’obi.

Ma ọ bụrụ na Sera ahọrọ Nke CH, ahụ́ ga-aka eru ya ala n’ihi na ha ahapụla ịkọ ihe ọ bụla gbasara ụlọ akwụkwọ mgbe ahụ. Ndị mụrụ ya ga-enwekwa obi ụtọ na ọ gbalịrị ka ya na ha kwurịta okwu. Ọ bụrụ na Sera ahọrọ Nke CH, ọ ga-aka abara ya na ndị mụrụ ya uru n’ihi na ha niile na-eme ihe e dere ná Ndị Filipaị 2:4, nke sịrị: “Echela echiche banyere nanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya n’ihe banyere ndị ọzọ na ihe ha na-eme.”—Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Emela Ka Ha Ghọtahie Gị

Cheta na ihe ị na-ekwu na ihe ndị mụrụ gị na-aghọta n’ihe i kwuru anaghị abụcha otu. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ndị mụrụ gị jụrụ gị ihe mere iwe ji ewe gị. Ọ bụrụ na ị zaa ha, sị: “Achọghị m ikwu banyere ya.” Ihe ha ga-aghọta bụ: “Agaghị m agwa unu n’ihi na atụkwasịghị m unu obi. Ọ bụ ndị enyi m ka m ga-agwa nsogbu m, ọ bụghị unu.” Dee ihe i chere banyere ihe ndị e kwuru n’okpuru ebe a. Ka e were ya na i nwere nsogbu gị na ya na-alụ, mama gị ma ọ bụ papa gị achọọ inyere gị aka.

Ọ bụrụ na ị sị: “Unu enyela onwe unu nsogbu. Nsogbu a akarịbeghị m.”

Ihe ndị mụrụ gị nwere ike ịghọta bụ: ․․․․․

Ihe ka mma i nwere ike ikwu bụ: ․․․․․

Olee ihe dị mkpa i kwesịrị ime? Chee ihe ị ga-ekwu eche nke ọma. Kwuo ya otú ga-egosi na ị na-akwanyere ha ùgwù. (Ndị Kọlọsi 4:6) Ghọta na ndị mụrụ gị bụ ndị enyi gị, ha abụghị ndị iro gị. Nke bụ́ eziokwu bụ na e kwesịrị inyere gị ezigbo aka ma ọ bụrụ na ị chọrọ imeri nsogbu ndị na-abịara gị.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na nsogbu gị abụghị otú ị ga-esi agwa ndị mụrụ gị okwu, kama ọ bụ na mgbe ọ bụla gị na ha kwuru okwu, unu na-ese okwu?

AMAOKWU BAỊBỤL

“Ihe nile m na-ekwu ziri ezi, sikwa n’obi m pụta.”—Job 33:3, Bible Nsọ Ọhụụ.

NDỤMỌDỤ

O siere gị ike ịkọrọ ndị mụrụ gị nsogbu gị mgbe gị na ha nọ n’ụlọ, kọọrọ ha ya mgbe unu na-aga n’ụzọ ma ọ bụ mgbe unu nọ n’ụgbọala ma ọ bụ mgbe unu gara ịzụ ihe.

Ị̀ MA NA . . . ?

Otú ahụ o nwere ike isiri gị ike ịgwa ndị mụrụ gị banyere ihe ụfọdụ dị mkpa ka o nwekwara ike isiri ha ike ịgwa gị banyere ụdị ihe ahụ ma ọ bụkwanụ ha echee na ha ekwesịghị ịgwa gị banyere ha.

IHE M GA-EME!

Mgbe ọzọ ọ dị m ka m ghara ịgwa papa m na mama m okwu, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na papa m ma ọ bụ mama m asị na m ga-ekwurịrị ihe m na-achọghị ikwu, ihe m ga-ekwu bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Olee uru ọ ga-abara gị ma ị chọta oge dị mma ị ga-eji kọọrọ ndị mụrụ gị ihe bụ́ mkpa gị?—Ilu 25:11.

● Gịnị mere o ji baa uru ka ị na-akọrọ ndị mụrụ gị nsogbu gị?—Job 12:12.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

“Mmadụ na ndị mụrụ ya ịkparịta ụka anaghị adị mfe mgbe niile. Ma ọ bụrụ na onye ahụ akata obi kọọrọ ha nsogbu o nwere, ọ ga-adị ya ka ebe e bupụrụ ibu arọ o bu.”—Devenye

[Foto dị na peeji nke 8]

Otú ahụ ihe nọchiri ụzọ na-agaghị eme ka ị ghara ịga ebe ị na-aga, i nwere ike ịchọta ụzọ ọzọ ị ga-esi gwa ndị mụrụ gị okwu!