Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Mụ na Ụmụnne M Ga-esi Na-ebi n’Udo?

Olee Otú Mụ na Ụmụnne M Ga-esi Na-ebi n’Udo?

ISI NKE 6

Olee Otú Mụ na Ụmụnne M Ga-esi Na-ebi n’Udo?

Olee otú i chere adịm ná mma gị na ụmụnne gị dị?

□ Anyị dị n’ezigbo mma

□ Anyị na-agbalị ka anyị ghara ịna-esekarị okwu

□ Anyị na-ese okwu mgbe niile

E NWERE ndị ha na ụmụnne ha dị n’ezigbo mma. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Felicia kwuru, sị: “Enwere m nwanne nwaanyị dị afọ iri na isii aha ya bụ Irena. Mụ na ya dị n’ezigbo mma.” Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Carly kwuru banyere nwanne ya nwoke dị afọ iri abụọ aha ya bụ Eric, sị: “Mụ na ya na-adị n’ezigbo mma. Anyị anaghị ese okwu.”

Ma, e nwere ọtụtụ ndị ha na ụmụnne ha na-eme ka Lauren na Marla. Lauren kwuru, sị: “O nweghị ihe na-anaghị esere mụ na Marla okwu, ma ihe na-enweghị ihe ọ bụ.” E nwekwara ndị ọ dị otú ọ dị Alice, onye dị afọ iri na abụọ. Alice kwuru banyere nwanne ya nwoke dị afọ iri na anọ aha ya bụ Dennis, sị: “Ọ na-akpasukarị m iwe! Ọ na-abata n’ime ụlọ m were ihe ọ bụla masịrị ya n’ebughị ụzọ gwa m. Dennis ka na-akpa àgwà ụmụaka!”

Ò nwere nwanne gị na-akpasukarị gị iwe? N’eziokwu, ọ bụ ndị mụrụ gị kwesịrị ịhụ na udo dị n’ụlọ unu. Ma, mee elu mee ala, i kwesịrị ịmụta otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-ebi n’udo. I nwere ike ịmụta ya ugbu a ị ka bi n’ụlọ unu.

Chetagodị oge ụfọdụ gị na nwanne gị sere okwu. Gịnị kacha esere unu okwu? Lee ihe ndị a e dere n’okpuru ebe a, kanye ✔ n’ihe ọ na-abụ nwanne gị mee, ya ewee gị ezigbo iwe!

Ihe ndị bụ́ nke m. Nwanne m na-ewere ihe m n’ebughị ụzọ gwa m.

Àgwà ya. Nwanne m na-achọ naanị ọdịmma onwe ya. Ọ naghị echebara m echiche. Ọ na-achọ ịna-atụrụ m ihe m ga-eme.

Ihe ndị o kwesịrị ịnata m ikike. Nwanne m anaghị akụ aka tupu ọ bata n’ime ụlọ m. Ọ na-agụ ozi iimel mụ ma ọ bụ ozi e ziteere m n’ekwe ntị n’ebughị ụzọ gwa m.

Ihe ọzọ ․․․․․

Ọ bụrụ na nwanne gị na-akpasukarị gị iwe, na-achọ ka ọ bụrụ ya na-atụrụ gị ihe ọ bụla ị na-eme ma ọ bụ na-ewere ihe gị n’ebughị ụzọ gwa gị, o nwere ike isiri gị ike ịhapụ iburu ya iwe n’obi. Ma otu ilu dị na Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụ ịpịsi aka ike n’imi na-akpata ọzọimi, ọ bụkwa iwe iwe na-akpata esemokwu.” (Ilu 30:33) Ọ bụrụ na i buru iwe n’obi, o nwere ike ime ka unu see ezigbo okwu otu ụbọchị otú ahụ mmadụ ịpịsi aka ike n’imi ya nwere ike ime ka ọbara si n’imi ya gbapụta. Unu see okwu, nsogbu ahụ ga-aka njọ. (Ilu 26:21) Gịnị ka ị ga-eme ka iwe a kpasuru gị ghara isere unu ezigbo okwu? Ihe mbụ i kwesịrị ime bụ ịchọpụta ihe kpatara nsogbu unu.

Esemokwu na Ihe Kpatara Ya

Esemokwu nwanne na nwanne yiri pịmpụl. Pịmpụl na-eto mmadụ n’elu ahụ́, ma ihe na-akpata ya dị n’ime ahụ́. Ọtụtụ mgbe, esemokwu nwanne na nwanne na-egosi na e nwere nsogbu.

Pịmpụl nwere ike ịla ma ị pịpụ ya. Ma ọ gaghị eme ka pịmpụl ahụ ghara ito ọzọ, kama o nwere ike ime ka i nwee àpà ebe ahụ ma ọ bụ mee ka pịmpụl ahụ ka njọ. Ọ ga-aka mma ka ị gwọọ ya, nke ga-eme ka ọ ghara ito gị ọzọ. Otú ahụ ka esemokwu nwanne na nwanne na-adị. Chọpụta ihe na-akpata ya. Ọ ga-eme ka ị mara otú ị ga-esi dozie ya ma zere ihe na-akpata ya. Ị ga-emekwa ihe Eze Sọlọmọn maara ihe kwuru, nke bụ́: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.”—Ilu 19:11.

Dị ka ihe atụ, Alice ahụ e dere ihe o kwuru ná mmalite sịrị na Dennis nwanne ya “na-abata n’ime ụlọ ya, were ihe ọ bụla masịrị ya n’agwaghị ya agwa.” Ọ bụ ya seere ha okwu. Ma, gịnị ka i chere kpatara esemokwu ahụ? O nwere ike ịbụ na nwanne ya anaghị akwanyere ya ùgwù. N’ihi nsogbu ahụ, Alice nwere ike ịgwa Dennis nwanne ya ka ọ kwụsị ịbata n’ime ụlọ ya ma ọ bụ ka ọ kwụsị imetụ ihe ya ọ bụla aka. Ma ọ gaghị eme ka nsogbu ahụ kwụsị. O nwedịrị ike ime ka ọ ka njọ. Ma, ọ bụrụ na Alice ejiri obiọma kọwaara Dennis na otú ahụ o si abata n’ime ụlọ ya na otú ahụ o si ewere ihe ya n’ebughị ụzọ gwa ya adịghị mma, o doro anya na ha abụọ agaghị na-esekarị okwu.

Mụta Idozi Esemokwu ma Ọ Bụ Izere Ya

N’eziokwu, ịmata ihe na-akpatara gị na nwanne gị esemokwu abụghị naanị ihe ga-eme ka nsogbu unu bie. Gịnị ka i nwere ike ime iji dozie esemokwu unu ma mee ka unu abụọ ghara ise okwu ụbọchị ọzọ? Gbalịa mee ihe isii a anyị ga-atụle ugbu a.

1. Kwekọrịtanụ ihe unu ga na-eme. Legodị anya n’ihe ahụ i dere seere gị na nwanne gị okwu. Lee ma è nwere ihe unu abụọ ga-ekwekọrịta ịna-eme, nke ga-eme ka unu ghara ịna-ese okwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe seere unu okwu bụ iwere ihe gị n’ebughị ụzọ gwa gị, Ihe Mbụ unu nwere ike ikwekọrịta ịna-eme bụ: “Mgbe onye ọ bụla chọrọ iwere ihe, ọ ga-ebu ụzọ gwa onye nwe ya.” Ihe Nke Abụọ nwere ike ịbụ: “Ọ bụrụ na onye nwe ya asị, ‘Mba, ewerela ya,’ onye nke ọzọ agaghị esi ọnwụ were ya.” Mgbe unu na-ekwekọrịta ihe unu ga na-eme, chetanụ na Jizọs nyere iwu, sị: “Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Ọ bụrụ na gị na nwanne gị buru ihe a Jizọs kwuru n’obi, ọ ga-eme ka ihe unu ga-ekwekọrịta bụrụ ihe unu ga-emeli. Gwazienụ papa unu na mama unu ihe unu kwekọrịtara, ka unu chọpụta ma hà ga-ekwe.—Ndị Efesọs 6:1.

2. Na-eme ihe ahụ unu kwekọrịtara. Pọl onyeozi dere, sị: “Otú ọ dị, gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị? Gị onye na-ekwusa ‘Ezula ohi,’ ị̀ na-ezu ohi?” (Ndị Rom 2:21) Olee otú ị ga-esi na-eme ihe a Baịbụl kwuru? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ka nwanne gị na-akụ aka tupu ya abata n’ime ụlọ gị ma ọ bụ ka ọ ghara ịgụ ozi e ziteere gị n’ekwe ntị ma ọ bụ ozi iimel gị n’ebughị ụzọ gwa gị, gịnwa kwesịrị ịna-emere ya otú ahụ.

3. Ewela iwe ọsọ ọsọ. Gịnị mere ihe a ji bụrụ ezigbo ndụmọdụ? Ọ bụ n’ihi na a tụrụ ilu na Baịbụl, sị: “Ekwela ka a kpasue [gị iwe] ọsọ ọsọ, n’ihi na idebe iwe n’obi bụ omume nzuzu.” (Ekliziastis 7:9, Bible Nsọ Ọhụụ) Ọ bụrụ na ị na-ewe iwe ọsọ ọsọ, o nweghị mgbe obi ga na-adị gị mma. Nke bụ́ eziokwu bụ na nwanne gị ga na-eme ihe na-akpasu gị iwe. Ma, jụọ onwe gị, sị, ‘Èmetụla m ya ụdị ihe ahụ?’ (Matiu 7:1-5) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jenny kwuru, sị: “Mgbe m dị afọ iri na atọ, echere m na isi jụrụ m oyi karịa onye ọ bụla, na ọ bụ ihe ọ bụla m kwuru kacha mkpa, nakwa na ọ bụ ihe a ga-emerịrị. Ugbu a, nwanne m nwaanyị nke obere echewekwala otú ahụ. N’ihi ya, m na-agbalị ka ihe o kwuru ghara iwe m iwe.”

4. Gbaghara ma chefuo ihe e mere gị. E nwee ihe seere gị na nwanne gị okwu, unu kwesịrị ikwurịta ya ma dozie ya. Ma ì kwesịrị ịgwa nwanne gị okwu maka ihe ọ bụla o mere gị? Obi ga-atọ Jehova Chineke ụtọ ma ị ‘na-eleghara mmejọ anya.’ (Ilu 19:11) Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Alison sịrị: “Mụ na Rechel nwanne m see okwu, anyị na-edozi ya. O nweghị onye n’ime anyị ọ na-esiri ike ịsị ibe ya ‘ewela iwe.’ Anyị na-ekwurịtazi ihe anyị chere kpatara esemokwu ahụ. Mgbe ụfọdụ, o mee ihe were m iwe, m na-echere ruo n’echi ya tupu mụ agwa ya banyere ya. Achọpụtala m na ọtụtụ mgbe, chi bọọ, iwe ihe ahụ na-apụ m n’obi. Anaghịzi m achọ ikwu banyere ya.”

5. Gwa papa gị na mama gị ka ha kpeziere unu. Ọ bụrụ na gị na nwanne gị enweghị ike idozi ihe na-esere unu, papa unu na mama unu nwere ike ikpeziri unu. (Ndị Rom 14:19) Ma, cheta na ọ bụrụ na unu edozie nsogbu unu n’agaghị kpọwa ndị mụrụ unu, ọ na-egosi na unu aghọwala dimkpa.

6. Jiri àgwà ọma ụmụnne gị nwere kpọrọ ihe. Ụmụnne gị nwere ike inwe àgwà na-amasị gị. Dee otu àgwà ọma na-amasị gị ị ma onye nke ọ bụla n’ime ha nwere.

Aha ha

․․․․․

Àgwà na-amasị m

․․․․․

Kama ịna-echegbu onwe gị banyere ihe ha na-emejọ, ọ́ gaghị adị mma ka i wepụta oge jaa ha mma maka àgwà ha ndị na-amasị gị?—Abụ Ọma 130:3; Ilu 15:23.

Baịbụl kwuru na o nwere ike ọ gaghị abụ nwanne gị ka gị na ya ga-akacha dịrị ná mma. (Ilu 18:24) Ma i nwere ike ime ka gị na ụmụnne gị na-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na ị ‘na-ediri ha ihe,’ ọ bụrụgodị mgbe e nwere ezigbo ‘ihe mere ị ga-eji mee mkpesa.’ (Ndị Kọlọsi 3:13) I mee otú ahụ, o nwere ike ime ka ihe ụmụnne gị na-eme ghara ịna-agbakasị gị ahụ́. O nwekwara ike ime ka gịnwa ghara ịna-akpasukarị ha iwe!

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Olee otú ị ga-esi amata na i toruola ịga biri nke onwe gị?

AMAOKWU BAỊBỤL

“Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.”—Ndị Filipaị 4:5.

NDỤMỌDỤ

E nwee nwanne gị ihe na-anaghị adabachara gị na ya, elela ya anya ọjọọ! Were ya na ọ na-enyere gị aka ịmụta àgwà ndị ga-emecha baara gị uru.

Ị̀ MA NA . . . ?

I si n’ụlọ unu kwapụ, a ga-enwe mgbe ndị gị na ha nọ ga-akpasu gị iwe, ma ndị ọrụ ibe gị ma ndị ọzọ, bụ́ ndị na-akparị mmadụ, ndị obi fere azụ, na ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Ọ bụ ugbu a ị ka bi n’ụlọ unu ka ị ga-amụta otú gị na ụdị ndị ahụ ga-esi na-emekọ ihe n’udo.

IHE M GA-EME!

Ihe mụ na nwanne m ma ọ bụ ụmụnne m nwere ike ikwekọrịta ịna-eme bụ ․․․․․

Ihe m ga-eme ka m ghara ịna-akpasukarị nwanne m ma ọ bụ ụmụnne m iwe bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị mata ihe dị iche n’okwu gị na nwanne gị sere na ihe kpatara ya?

● Olee uru i chere mmadụ na-erite ma o nwee ụmụnne?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 46]

“E wezụga ụmụnne m, a gaaraghị enwe ihe ndị ọ na-abụ m cheta ha ugbu a, obi adị m ezigbo ụtọ. Ihe m na-agwa ndị nwere ụmụnne bụ, ‘Ejila ha egwu egwu!’”—Marilyn

[Igbe dị na peeji nke 42]

Ebe M Dere Ihe

Chọpụta Ihe Kpatara Esemokwu Ahụ

Ị̀ chọrọ ịmụtakwu otú ị ga-esi na-achọpụta ihe na-akpatara gị na nwanne gị esemokwu? Ọ bụrụ na ị chọrọ, gụọ akụkọ ahụ Jizọs kọrọ banyere nwa mmefu ahụ gara mefusịa ihe niile nna ya kenyere ya. (Luk 15:11-32) Gụgharịa ebe ahụ e kwuru ihe nwanne nwa mmefu ahụ mere mgbe nwa mmefu ahụ lọtara. Zazie ajụjụ ndị a.

Gịnị kpasuru nwanne nwa mmefu ahụ iwe? ․․․․․

Olee ihe i chere bụ́ nsogbu ya? ․․․․․

Olee otú nna ha si gbalịa idozi okwu ahụ? ․․․․․

Gịnị ka nwanne nwa mmefu ahụ kwesịrị ime iji dozie nsogbu ahụ? ․․․․․

Ugbu a, cheta okwu gị na nwanne gị sere na nso nso a. Dee azịza gị n’akụkụ ajụjụ ndị a.

Gịnị seere unu okwu? ․․․․․

Gịnị ka i chere mere ihe ahụ ji seere unu okwu? ․․․․․

Gịnị ka unu abụọ ga-ekwekọrịta ịna-eme nke ga-enyere unu aka ikpezi, meekwa ka ihe ahụ ghara isere unu okwu n’oge ọzọ? ․․․․․

[Foto dị na peeji nke 43]

Esemokwu nwanne na nwanne yiri pịmpụl. Ị chọọ idozi ya, kama ilebara naanị okwu ahụ unu sere anya, lebara ihe kpatara ya anya