Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ètoruola M Ịga Biri nke Onwe M?

Ètoruola M Ịga Biri nke Onwe M?

Isi nke 7

Ètoruola M Ịga Biri nke Onwe M?

“Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka ndị mmadụ hà na-eleda m anya n’ihi na eruola m afọ iri na itoolu ma ka biri n’ụlọ ndị mụrụ m. Ọ dịzi ka ọ̀ bụ ibiri nke onwe m ga-egosi na mụ eruola ihe e ji mmadụ eme.”—Katie.

“Ọ fọrọ obere ka m ruo afọ iri abụọ, ọ na-ewekwa m iwe na ndị mụrụ m anaghị ekwe m jiri aka m na-ekpebi ihe m chọrọ ime. Echeela m echiche ịga biri nke onwe m.”—Fiona.

TUPU gị etoruo ịga biri nke onwe gị, o nwere ike ịbụ na ị na-achọ iji aka gị na-ekpebi ihe ị ga-eme. Ịchọ ime otú ahụ adịghị njọ. A sị ka e kwuwe, dị ka a kọwara n’Isi nke 3, mgbe Chineke kere mmadụ, o bu n’obi na ụmụaka ga-eto, mechaa hapụ nne ha na nna ha ma nwee ezinụlọ nke ha. (Jenesis 2:23, 24; Mak 10:7, 8) Ma, olee otú ị ga-esi mara ma ì toruola n’eziokwu ibiri nke onwe gị? Lebagodị anya n’ajụjụ atọ dị mkpa i kwesịrị ịza. Nke mbụ bụ . . .

Gịnị Mere M Ji Chọọ Ịga Biri nke Onwe M?

Leba anya n’ihe ndị e dere n’okpuru ebe a. Dee 1 n’ihe nke mbụ mere i ji chọọ ịga biri nke onwe gị, dee 2 n’ihe nke abụọ, derezie ya otú ahụ na-aga.

․․․․․ Achọrọ m ịgbara nsogbu ndị dị n’ezinụlọ anyị ọsọ

․․․․․ Achọrọ m iji aka m na-ekpebi ihe ndị m na-eme

․․․․․ Achọrọ m ka ndị enyi m na-akwanyere m ùgwù

․․․․․ Achọrọ m ịga biri na nke enyi m na-achọ onye ya na ya ga-ebi

․․․․․ Achọrọ m ịga nye aka n’ebe e nwere mkpa

․․․․․ Achọrọ m ịmụta otú m ga-esi na-emere onwe m ihe

․․․․․ Achọghịzi m ka ndị mụrụ m na-akpa afọ m

․․․․․ Ihe ọzọ ․․․․․

O nweghị nke ọ bụla n’ihe ndị a a ga-asị na ọ dị njọ. Ma, ihe ị ga-ajụ onwe gị bụ, Gịnị mere m ji chọọ ịga biri nke onwe m? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe mere i ji chọọ ịga biri nke onwe gị bụ ka ị gbaara nsogbu ndị dị n’ezinụlọ unu ọsọ, ihe ị ga-emecha chọpụta nwere ike iju gị anya!

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Danielle gara bitụ nke onwe ya mgbe ọ dị afọ iri abụọ. Ọ mụtara ọtụtụ ihe mgbe ahụ. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nọ n’ụwa a ga-enwerịrị ihe ụfọdụ ọ chọrọ ime ọ na-agaghị enwe ike ime. Ị gaa biri nke onwe gị, o nwere ihe ndị ị na-agaghị emeli n’ihi na ọrụ gị agaghị enye gị ohere ma ọ bụkwanụ n’ihi na i nweghị ego.” Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Carmen hapụrụ ndị mụrụ ya gaa bie ọnwa isii ná mba ọzọ. Ọ sịrị: “Obi dị m ụtọ mgbe ahụ, ma ọ na-adịkarị m ka anaghị m enwe ohere! Ọ bụ m na-arụ ọrụ ụlọ niile, ma ịza ụlọ ma ịrụzi ihe mebiri emebi ma ịsụchasị gburugburu ebe m bi ma ịsa ákwà ma ihicha ụlọ ma ihe ndị ọzọ.”

Ekwela ka ndị ọzọ kwanye gị ọkụ n’ahụ́ ka i jiri ọsọ gaa biri nke onwe gị. (Ilu 29:20) Ọ bụrụgodị na e nwere ezigbo ihe mere i ji chọọ ịga biri nke onwe gị, ọ bụghị naanị ya kwesịrị ime ka i si n’ụlọ unu kwapụ. I kwesịrị ịmụta otú ị ga-esi na-egboro onwe gị mkpa. N’ihi ya, ajụjụ nke abụọ ị ga-aza bụ . . .

Èjikerela M?

Ịkwapụ gaa biri nke onwe gị yiri ịga ntá n’oké ọhịa n’abalị. Ị̀ ga-ebili gawa naanị gị ma ọ bụrụ na ị maghị ụzọ, i jighị égbè, mma, ọkụ, ị maghịkwanụ otú e si agba ntá? Ị gaghị eme otú ahụ! Ma, ọtụtụ ndị na-eto eto na-esi n’ụlọ ha kwapụ mgbe ha na-amụtabeghị otú e si arụ ọrụ a na-arụ n’ụlọ.

Sọlọmọn, bụ́ eze maara ihe, kwuru na “onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.” (Ilu 14:15) Ihe ga-enyere gị aka ịmata ma ì jikerela ịga biri nke onwe gị bụ ichebara ihe ndị a anyị na-aga ịtụle echiche. Kanye na nke ọ bụla ị ma eme, kanyekwa X na nke ị na-amaghị eme.

Iji ego eme ihe bara uru: Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Serena sịrị: “Ejitụbeghị m ego m kwụọ ụgwọ ihe ọ bụla. Ụjọ na-atụ m ịga biri nke onwe m ma jiri ego m na-akwụ ụgwọ ihe niile.” Olee otú ị ga-esi mụta iji ego gị na-eme ihe bara uru?

Otu ilu dị na Baịbụl sịrị: “Onye maara ihe ga-ege ntị ma nwetakwuo ntụziaka.” (Ilu 1:5) N’ihi ya, ọ ga-adị mma ma ị jụọ papa gị na mama gị ego ole o nwere ike ifu otu onye kwa ọnwa iji kwụọ ụgwọ ụlọ, zụta nri, lekọta ụgbọala ma ọ bụ gbaa ụgbọ gaa ebe ndị ọ chọrọ ịga. Gwazie ha ka ha kụziere gị otú ị ga-esi na-ahazi ego ị na-akpata na ego ị na-emefu. *

Ịrụ ọrụ a na-arụ n’ụlọ: Otu nwa okorobịa dị afọ iri na asaa aha ya bụ Brian kwuru na ya cheta ịga biri nke onwe ya, ihe na-akacha atụ ya ụjọ bụ ịsa ákwà ya. Olee otú ị ga-esi mara ma ì jikerela ịna-egboro onwe gị mkpa gị? Nwa okorobịa ọzọ dị afọ iri abụọ aha ya bụ Aron kwuru ihe i nwere ike ime. Ọ sịrị: “Gbalịa wepụta otu izu mee ka ì birila nke onwe gị. Jiri ego gị zụọ ihe ị ga-eri. Jiri aka gị sie ya ma ọ bụ gị azụrụ nke e siri esi. Jiri aka gị saa uwe gị ma dee ya ayọn. Jiri aka gị na-edewe ụlọ gị ọcha. Gbalịakwa jiri ego gị kwụọ ụgwọ ụgbọala ọ bụla ị bara.” I mee ihe ahụ Aron kwuru, o nwere uru abụọ ọ ga-abara gị. Nke mbụ bụ na ọ ga-eme ka ị mụta ihe ndị ga-abara gị uru. Nke abụọ abụrụ na ọ ga-eme ka i jiri ihe papa gị na mama gị na-emere gị kpọrọkwuo ihe.

Gị na ndị ọzọ imekọ ihe n’udo: Gị na ndị mụrụ gị na ụmụnne gị ùnu na-ebi n’udo? Ọ bụrụ na unu anaghị ebi n’udo, i nwere ike iche na ihe ga-aka mma ma gị na enyi gị biri. Ma chegodị banyere ihe otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Iv kọrọ. Ọ sịrị: “Ndị enyi m abụọ gara bikọta ọnụ. Tupu ha ebiri, ha dị n’ezigbo mma, ma ha mechara tisaa. Otu na-adị ọcha, onye nke ọzọ na-eru unyi. Otu ji ife Chineke kpọrọ ihe, onye nke ọzọ ejichaghị ya kpọrọ ihe. O kweghị ha obibi!”

Gịnị ka i kwesịrị ime? Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Erin kwuru, sị: “Mgbe gị na ndị mụrụ gị ka bi, e nwere ọtụtụ ihe ị ga-amụta banyere otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-ebi n’udo. Ị ga-amụta otú ị ga-esi na-edozi nsogbu ọ bụla gị na mmadụ nwere nakwa otú ị ga-esi na-agbachi nkịtị n’ihe ụfọdụ. Achọpụtala m na ọ bụrụ na mmadụ agaa biri nke onwe ya n’ihi na ọ chọrọ ịgbara esemokwu ya na ndị mụrụ ya ọsọ, ọ ga-amụta otú e si agbara nsogbu ọsọ kama ịmụta otú e si edozi ya.”

Ime ihe gbasara ofufe Chineke: Ihe mere ụfọdụ ndị ji aga ebiri nke onwe ha bụ na ha chọrọ ịkwụsị iso ndị mụrụ ha na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke. Ndị ọzọ chere na ha biri nke onwe ha, ha ka ga na-amụ Baịbụl, na-emekwa ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Chineke. Ma ha bitụ nke onwe ha, ha ejiri nwayọọ nwayọọ kpawa àgwà ọjọọ. Gịnị ka ị ga-eme ka ‘okwukwe gị ghara ikpu dị ka ụgbọ’? *1 Timoti 1:19.

Jehova Chineke chọrọ ka anyị niile jiri aka anyị chọpụta ihe mere anyị ji kwere ihe anyị kweere. (Ndị Rom 12:1, 2) N’ihi ya, wepụta oge ị ga-eji na-amụ Baịbụl na oge ị ga-eji na-eme ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Chineke. Ekwekwala ka ihe ọ bụla gbochie gị ịna-eme ha. Ọ́ gaghị adị mma ma i dee ụbọchị na oge ị na-eji eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke na kalenda gị ma lee ma ì nwere ike ịna-emechi ha anya ruo otu ọnwa n’enweghị mgbe ndị mụrụ gị chetaara gị ha?

N’ikpeazụ, ajụjụ nke atọ i kwesịrị ịza bụ . . .

Gịnị Ka M Na-aga Ime?

Ihe mere i ji chọọ ịga biri nke onwe gị ọ̀ bụ ka ị gbaara nsogbu dị n’ezinụlọ unu ọsọ? Ka ọ̀ bụ ka ndị mụrụ gị ghara ịna-agwa gị ihe ị ga-eme? Ọ bụrụ otú ahụ, ebe i lekwasịrị anya bụ n’ihe ị ga-ahapụ, ọ bụghị n’ihe ị na-aga ime. Ma e nwere ike iji onye na-eme otú ahụ tụnyere onye na-akwọ ụgbọala nke na-elekwasị anya n’enyo o ji ahụ ihe dị n’azụ. Ọ bụrụ na o lekwasị anya n’enyo ahụ, naanị ihe ọ ga na-ahụ bụ ihe ndị ọ gbaferela, ọ gaghị ahụ ihe dị n’ihu. Gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe atụ a? Elekwasịla anya naanị n’otú ị ga-esi pụọrọ ndị mụrụ gị n’ụlọ, kama lekwasị anya n’ihe bara uru ị na-aga ime.

Ụfọdụ ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova na-akwaga ebe ọzọ n’obodo ha ma ọ bụkwanụ ná mba ọzọ ịga kwusaa ozi ọma. Ndị ọzọ na-akwaga ebe ọzọ ka ha nye aka wuo ebe Ndịàmà Jehova na-anọ efe Chineke ma ọ bụ ka ha gaa rụọ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ha. Ma e nwere ndị chere na ha kwesịrị ibitụ nke onwe ha tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye. *

N’agbanyeghị ihe ị na-aga ime, chebara ya echiche. Otu ilu dị na Baịbụl sịrị: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru, ma onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.” (Ilu 21:5) Gee ndị mụrụ gị ntị. (Ilu 23:22) Kpee ekpere banyere ya. Ka ị na-ekpebi ihe ị ga-eme, chebara ndụmọdụ Baịbụl ndị a kọwara n’isiokwu a echiche.

Ihe i kwesịrị ịjụ onwe gị abụghị Ètoruola m ibiri nke onwe m? Kama ọ bụ Àmụtala m ihe ndị m kwesịrị ịna-arụ n’ụlọ ma m biri nke onwe m? Ọ bụrụ na ị zara ee n’ajụjụ nke abụọ ahụ, o nwere ike ịbụ na oge eruola ka ị gaa biri nke onwe gị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 32 N’obodo ụfọdụ, nwatakịrị na-ebi n’ụlọ ndị mụrụ ya ruo mgbe ọ ga-alụ di ma ọ bụ nwunye, nke ka nke, ma ọ bụrụ nwa nwaanyị. O nweghị iwu Baịbụl nyere banyere ya.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya.”—Matiu 19:5.

NDỤMỌDỤ

Wepụta ihe dị ka otu ọnwa ị ga na-enye ndị mụrụ gị ego ihe ndị ha mefuru n’isi gị, ma ego nri ma ụgwọ ụlọ ma ego ihe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na i nweghị ike ịkwụ ha ụgwọ ihe ndị ahụ ma ọ bụkwanụ na ị chọghị ịkwụ ya, mara na i jikerebeghị ibi nke onwe gị.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ihe mere i ji kwapụ n’ụlọ unu nwere ike ime ka obi dị gị ụtọ ma ọ bụ jọọ gị njọ.

IHE M GA-EME!

Ihe m na-aga ime ma m si n’ụlọ anyị kwapụ bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Ọ bụrụgodị na nsogbu dị n’ezinụlọ unu, olee uru ị ga-erite ma i bitụkwuo n’ụlọ unu?

● Ugbu a ị ka bi n’ụlọ unu, gịnị ka i nwere ike ime nke ga-abara ndị ezinụlọ unu uru, meekwa ka ị mụta otú ị ga-esi na-elekọta ezinụlọ nke gị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 52]

“Mmadụ ịchọ ibiri nke onwe ya adịghị njọ. Ma ọ bụrụ na ihe mere i ji chọọ ịga biri nke onwe gị bụ ka ndị mụrụ gị kwụsị ịna-agwa gị ihe ị ga-eme, ọ pụtara na i torubeghị ịga biri nke onwe gị.”—Aron

[Foto dị na peeji nke 50, 51]

Ịkwapụ gaa biri nke onwe gị yiri ịga ntá n’oké ọhịa n’abalị. I kwesịrị ịmụta otú e si achụ ntá tupu ị gawa