Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụdị Uwe M Kwesịrị Ịna-eyi?

Olee Ụdị Uwe M Kwesịrị Ịna-eyi?

ISI NKE 11

Olee Ụdị Uwe M Kwesịrị Ịna-eyi?

Rut chọrọ ịpụ apụ, ma uwe o yi riri ndị mụrụ ya ọnụ.

Ihe pụrụ papa ya n’ọnụ bụ, “Agwakwala m na ọ bụ ihe a ka i yi apụ.”

Ihe ahụ o kwuru juru Rut anya, ya asị ya, “Ò nwere ihe o mere? M chọrọ iso ndị enyi m gaa zụrụ ihe.”

Mama ya asị ya, “Ị gaghị eyi ihe ahụ apụ!”

Rut ejiri olu ákwá sị, “Mama, ọ bụ ụdị uwe a ka ụmụaka ibe m niile na-eyi. O nwekwara ihe ọ na-egosi!”

Papa ya ejiri olu ike sị ya, “Ihe ahụ ọ na-egosi adịghị anyị mma! Ngwa, gaa yipụ ihe ahụ ọsọ ọsọ! Ma í yipụghị ya, ị gaghị esi ebe a apụ!”

Ọ BỤGHỊ taa ka uwe seweere ndị nne na nna na ụmụ ha okwu. O nwere ike mgbe ndị mụrụ gị hà ka gị, ụdị ihe a seere ha na ndị mụrụ ha okwu. N’oge ahụ, obi nwere ike ịdị ha otú ọ na-adị gị ugbu a! Ma ugbu a, otú ha si ele ihe anya agbanweela, nke mere ka ihe gbasara uwe ị ga-eyi na-esekarịrị gị na ha okwu.

Ị sị: Ọ dị mụ mma n’ahụ́.

Ha asị : Ọ dịghị mma n’anya.

Ị sị: Ọ mara ezigbo mma!

Ha asị: Ọ dị ka nke ndị akwụna.

Ị sị: Ọ dịghị ọnụ.

Ha asị: kwesịghị ịdị ọnụ. . . . Ọ hà ka uwe ụmụaka!

È nwere otú ọgụ na mgba a ga-esi akwụsị? Ee! Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na atọ aha ya bụ Megan chọpụtara ihe ga-akwụsị ya. Ọ sịrị: “Gị na ha ekwesịghị ịrụwa ụka. Unu nwere ike ikwekọrịta.” Ọ̀ ga-ekwe omume? Ọ̀ pụtaziri na ị ga na-eji ejiji ka agadi? Mbanụ! Nkwekọrịta a na-ekwu okwu ya ebe a bụ na gị na ndị mụrụ gị ga-anọkọ kwurịta ihe na-esere unu, ma kpebie ihe ga-adị ha mma, dịkwa gịnwa mma. Olee uru ọ ga-abara gị?

1. Ị ga na-adị mma n’anya, ma n’anya ndị ọgbọ gị.

2. Ndị mụrụ gị agaghị na-ekwu na uwe i yi adịghị mma.

3. Ndị mụrụ gị hụwa na ị na-eyi uwe dị mma, ha nwedịrị ike ịhapụ gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ndị ọzọ ị chọrọ ime.

Ka anyị leba anya n’ihe i kwesịrị ime. Were ya na ị hụrụ otu uwe n’ahịa ma ọ bụkwanụ nke otu enyi gị yi, ya adị gị ka ị̀ ga-enwerịrị ya. Ihe mbụ ị ga-eme bụ . . .

Chebara Ihe Baịbụl Kwuru Echiche

Baịbụl ekwughị ọtụtụ ihe banyere uwe. N’eziokwu, i nwere ike iji nkeji ole na ole gụchaa ndụmọdụ niile Akwụkwọ Nsọ nyere banyere uwe! Ma ná nkeji ole na ole ahụ, ị ga-amụta ọtụtụ ihe ga-abara gị ezigbo uru. Dị ka ihe atụ:

● Baịbụl gwara ụmụ nwaanyị ka ha na-achọ onwe ha mma “n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè.” *1 Timoti 2:9, 10.

Obi nwere ike ịmapụ gị ma e kwute okwu ‘imeru ihe n’ókè.’ I nwere ike ịna-eche, ‘Ọ̀ pụtaziri na m ga na-eji ejiji ka Mgbeeke?’ Mbanụ! N’ebe a, imeru ihe n’ókè pụtara na uwe gị ga-egosi na ị na-akwanyere onwe gị ùgwù nakwa na ị na-echebara ndị ọzọ echiche. (2 Ndị Kọrịnt 6:3) E nwere ụdị uwe dị iche iche ọ ga-abụ i yiri, ya egosi na ị na-eme otú ahụ. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na atọ aha ya bụ Danielle sịrị: “O nwere ike isitụrụ gị ike, ma i nwere ike ịna-eyi uwe mara mma nke na-agaghị eme ka onye ọ bụla hụrụ gị kiriwe gị.”

● N’ihe gbasara ejiji, Baịbụl kwuru na i kwesịrị ilekwasị anya ná “mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi,” ma ọ bụ, dị ka Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society si kwuo ya, ‘mma si n’ime ime gị pụta.’—1 Pita 3:4.

Iyi uwe na-adịghị mma n’anya nwere ike ime ka onye ọ bụla hụrụ gị kiriwe gị. Ma, ọ bụ àgwà ọma gị ga-eme ka ndị torola eto na ndị na-eto eto ibe gị na-akwanyere gị ùgwù. Ọ̀ bụ eziokwu na ndị na-eto eto ibe gị ga-eso na-akwanyere gị ùgwù? Ee, hanwa nwere ike ịchọpụta na iyi uwe na-adịghị mma n’anya adịghị mma. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Brittany kwuru, sị: “Ọ na-ewute m ma m hụ otú ụmụ agbọghọ si agba ọtọ, sị na ha yi uwe, n’ihi na ha chọrọ ka ụmụ nwoke hụ ha!” Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Kay kwetara ihe a o kwuru. O kwuru banyere otu nwa agbọghọ bụ́bu enyi ya, sị: “Uwe ya niile bụ uwe ‘hụrụ m hụrụ m.’ Ọ chọrọ ka ụmụ okorobịa hụ ya. Ọ bụ ya mere o ji eyi ihe ọ bụla nwere ike ịdọta ha.”

Jụọ Ndị Mụrụ Gị Ihe Ha Chere

Ọ dịghị mma ịchịnye uwe ị ma na ọ dịghị mma n’akpa akwụkwọ gị ma yiri ya ma i ruo n’ụlọ akwụkwọ. Ndị mụrụ gị ga-atụkwasịkwu gị obi ma ọ bụrụ na ị na-agwa ha eziokwu ma na-akọrọ ha ihe niile, ọ bụrụgodị ihe ndị ị ma na ha agaghị achọpụta. N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na i kwesịrị ịjụ ha ihe ha chere banyere uwe ị chọrọ ịzụ. (Ilu 15:22)—Igbe bụ́ “Otú Ị Ga-esi Kpebie Uwe Dị Mma,” nke dị na peeji nke 82 na nke 83, nwere ike inyere gị aka.

Gịnịkwanụ mere i ji kwesị ịjụ ha ihe ha chere? I nwere ike iche na ha achọghị ka i yiri uwe ọ bụla na-ewu ewu. Ma ọ bụchaghị eziokwu. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ihe niile masịrị gị na-amasị papa gị na mama gị, ma o nwere ike ịbara gị uru mgbe ụfọdụ. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Nataleine sịrị: “Ndụmọdụ ndị mụrụ m na-enye m na-eme m obi ụtọ, n’ihi na achọghị m ka uwe m yi si n’ụlọ pụọ menye m ihere ma ọ bụ mee ka ndị mmadụ kwuwe okwu ọjọọ banyere m.”

Ihe ọzọ bụ na i kwesịrị ịna-erubere ndị mụrụ gị isi ebe ọ bụ na ị ka bi n’ụlọ ha. (Ndị Kọlọsi 3:20) Ma mgbe ị ghọtara ihe ndị mụrụ gị chere, ha aghọtakwa ihe gịnwa chere, o nwere ike iju gị anya ma ị hụ otú gị na ha si ekwekọrịta n’ọtụtụ ihe. O nwere ike imecha mee ka okwu gbasara uwe ghara ịna-esere unu okwu!

Ihe Ị Ga-eburu n’Obi Banyere Uwe: Mgbe ị na-eyitụ uwe ị chọrọ ịzụ, echela naanị banyere otú ọ dị gị n’ahụ́ ma i lee anya n’enyo. I guzo ọtọ, uwe i yi nwere ike ịgbada agbada. Ị nọdụ ala ma ọ bụ hulata ka ị tụtụrụ ihe, o nwere ike ịgbago elu. O kwe omume, jụọ mama gị ma ọ bụ papa gị ma ọ bụkwanụ enyi gị ma nke a na-akọ ihe o chere banyere uwe ị chọrọ ịzụ.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Otú ị dị ọ̀ na-ewe gị ezigbo iwe? Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na otú ị dị adịghị gị mma?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 23 Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ụmụ nwaanyị ka Baịbụl nyere ndụmọdụ ahụ, ọ ga-abakwara ụmụ nwoke uru.

AMAOKWU BAỊBỤL

‘Ekwela ka mma ị na-achọ bụrụ iyi uwe elu, kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi.’—1 Pita 3:3, 4.

NDỤMỌDỤ

Eyila uwe ga-eme ka onye hụrụ gị chee na ị chọrọ inwe mmekọahụ. Ọ ga-eme ka i yie onye na-achụ nwoke nakwa onye ihe gbasara onwe ya na-echu ụra.

Ị̀ MA NA . . . ?

Mgbe mbụ mmadụ hụrụ gị, uwe i yi nwere ike ime ka o lee gị anya ọma ma ọ bụ anya ọjọọ.

IHE M GA-EME!

Onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ enyi m ma nke a na-akọ m nwere ike ịjụ ihe o chere banyere uwe m chọrọ ịzụ bụ ․․․․․

M chọọ ịzụ uwe n’oge ọzọ, ihe ndị m ga-echebara echiche bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere uwe ji esere ndị na-eto eto na ndị mụrụ ha okwu?

● Olee ihe ndị i nwere ike ịmụta ma gị na ndị mụrụ gị kwurịta banyere uwe ị chọrọ iyi?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 81]

“M hụ ụmụ agbọghọ yi uwe na-adịghị mma n’anya, ọ na-eme ka m ghara ịna-akwanyere ha ùgwù. Ma m hụ ndị yi uwe dị mma n’anya, ihe m na-ekwu n’obi m bụ, ‘Otú a ka m chọrọ ka m na-adị.’”—Nataleine

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 82, 83]

Ebe M Dere Ihe

Otú Ị Ga-esi Kpebie Uwe Dị Mma

Ihe Ị Ga-eme: Depụta ihe dị na peeji ndị a. Gwa papa gị na mama gị ka ha dejupụta nke dị n’aka nri, gịnwa edejupụta nke dị n’aka ekpe. Unu dechaa, nye ndị mụrụ gị nke ahụ i dere, narakwa ha nke hanwa dere. Gị na ha kwurịtazie ihe unu dere. È nwere ihe ndị juru gị anya? Olee ihe ọhụrụ ị mụtara banyere otú ndị mụrụ gị si ele ihe anya, oleekwa nke hanwa mụtara banyere otú i si ele ihe anya?

Nke Gị Chegodị banyere uwe ị chọrọ iyi ma ọ bụ ịzụ.

Gịnị mere uwe ahụ ji dị gị mma? N’ihe ndị a e dere, dee 1 n’ihe nke mbụ mere i ji chọọ ịzụ uwe ahụ, dee 2 na nke abụọ, derezie ya otú ahụ gawa.

․․․․․ Aha uwe ahụ

․․․․․ Ọ ga-eme ka ihe m masị ụmụ nwoke

․․․․․ Ụmụ agbọghọ ibe m na-eyi ya

․․․․․ Ọ dị mụ mma n’ahụ́

․․․․․ Ọ dịghị oké ọnụ

․․․․․ Ihe ọzọ ․․․․․

Ihe mbụ ndị mụrụ m nwere ike ikwu ma ha hụ ya bụ

□ “Azụkwala uwe ahụ!”

□ “Zụrụ ya ma ị chọọ.”

□ “Nsogbu adịghị.”

Ihe nwere ike ime ka ha jụ bụ

□ “Ọ dị ka nke ndị akwụna.”

□ “Ọ dịghị mma n’anya.”

□ “Ọ na-ewu ewu.”

□ “A ga-echewe na ndị mụrụ gị azụghị gị azụ.”

□ “Ọ dị oké ọnụ.”

□ Ihe ọzọ ․․․․․

Ànyị Nwere Ike Ikwekọrịta n’Ihe A?

Olee uru ihe ndị mụrụ m kwuru ga-abara m?

․․․․․

Gịnị ka e nwere ike ime ka uwe a dị mma?

․․․․․

Nke Ndị Mụrụ Gị Chegodị banyere uwe nwa unu chọrọ iyi ma ọ bụ ịzụ.

Gịnị ka unu chere mere uwe ahụ ji dị nwa unu mma? N’ihe ndị a e dere, dee 1 n’ihe nke mbụ unu chere mere o ji chọọ ịzụ uwe ahụ, dee 2 na nke abụọ, derezie ya otú ahụ gawa.

․․․․․ Aha uwe ahụ

․․․․․ Ọ ga-eme ka ihe ya masị ụmụ nwoke

․․․․․ Ụmụ agbọghọ ibe ya na-eyi ya

․․․․․ Ọ dị ya mma n’ahụ́

․․․․․ Ọ dịghị oké ọnụ

․․․․․ Ihe ọzọ ․․․․․

Ihe mbụ anyị kwuru mgbe anyị hụrụ ya bụ

□ “Azụkwala uwe ahụ!”

□ “Zụrụ ya ma ị chọọ.”

□ “Nsogbu adịghị.”

Ihe nwere ike ime ka anyị jụ bụ

□ “Ọ dị ka nke ndị akwụna.”

□ “Ọ dịghị mma n’anya.”

□ “Ọ na-ewu ewu.”

□ “A ga-echewe na anyị azụghị ya azụ.”

□ “Ọ dị oké ọnụ.”

□ Ihe ọzọ ․․․․․

Ànyị Nwere Ike Ikwekọrịta n’Ihe A?

Ihe mere na anyị achọghị ka nwa anyị yiri uwe a ọ̀ bụ naanị na ọ dịghị anyị mma?

□ Ee □ O nwere ike □ Ee e

Gịnị ka e nwere ike ime ka uwe a dị mma?

․․․․․

Ihe M Kpebiri Ime ․․․․․

[Igbe dị na peeji nke 84]

Ụmụ Nwoke Kwanụ?

Ndụmọdụ Baịbụl ndị a tụlere n’isiokwu a ga-abakwara ụmụ nwoke uru. Na-eji ejiji dị mma n’anya. Mee ka a hụ mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi gị, nke bụ́ àgwà ọma gị. Ị chọọ ịzụ uwe, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ụdị mmadụ ọ ga-egosi na m bụ? Ụdị onye ọ ga-egosi na m bụ ọ̀ bụ ụdị onye m bụ n’eziokwu?’ Cheta na uwe mmadụ yi na-egosi ụdị onye ọ bụ. Na-eyi uwe ndị ga-egosi ụdị onye ị bụ n’eziokwu!

[Foto dị na peeji nke 80]

Uwe i yi na-egosi ndị mmadụ ụdị onye ị bụ. Olee ụdị mmadụ uwe gị na-egosi na ị bụ?