Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Obi Na-esikwu M Ike?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Obi Na-esikwu M Ike?

ISI NKE 12

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Obi Na-esikwu M Ike?

Ee Ee e

I lee onwe gị n’enyo, otú ị dị ọ̀ na-amasị gị? □ □

Ì chere na e nwere ihe bara uru ị ma eme? □ □

Ị̀ na-emeri nsogbu ndị ọgbọ gị na-enye gị? □ □

Ị̀ na-anabata ezigbo mba a baara gị? □ □

Ndị ọzọ kwuo okwu ọjọọ banyere gị, ị̀ na-eme ihe i kwesịrị ime? □ □

Ì chere na ndị mmadụ hụrụ gị n’anya? □ □

Ị̀ na-elebara onwe gị anya? □ □

Obi ọ̀ na-adị gị ụtọ ma ndị ọzọ mee nke ọma? □ □

Ì chere na ị na-eme nke ọma n’ihe ndị ị na-eme? □ □

Ọ bụrụ na ị zara ee e n’ọtụtụ n’ime ajụjụ ndị a, o nwere ike ịbụ na obi anaghị esi gị ike n’ihi na i chere na o nweghị ihe ị na-emeta. Isiokwu a ga-enyere gị aka ịchọpụta ihe ndị ị ma eme!

ỌTỤTỤ ndị na-eto eto na-echegbukarị onwe ha n’ihi na ha chere na ha jọrọ njọ, na o nweghị ihe ha ma eme, nakwa na o nweghị ebe ha ruru eru ma e jiri ha tụnyere ndị ọgbọ ha. Ị̀ na-eche otú ahụ? Ọ bụrụ na ị na-eche otú ahụ, ọ bụghị naanị gị!

“Ihe m na-emejọ na-eme ka obi na-ajọ m njọ. M na-akatọkarị onwe m.”—Leticia.

“Otú ọ sọkwara gị maruo ná mma, ị ga na-ahụ ndị makarịrị gị.”—Haley.

“Ahụ́ anaghị eru m ala ma mụ na ndị mmadụ nọrọ. Ụjọ na-atụ m na ndị ọzọ ga-eche na mụ amaghị ihe.”—Rechel.

Ọ bụrụ na ị na-eche ka ndị a, adala mbà. E nwere ihe ga-enyere gị aka. Tụlee ihe atọ ga-eme ka obi na-esikwu gị ike, nke ga-eme ka ị chọpụta na e nwere ihe ndị ị ma eme.

Na-enyere Ndị Ọzọ Aka

Ihe Baịbụl kwuru. “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

Ihe ọ pụtara. Mgbe ị na-enyere ndị ọzọ aka, ị na-enyere onwe gị aka. Olee otú o si bụrụ eziokwu? Otu ilu dị na Baịbụl sịrị: “Mkpụrụ obi nke na-emesapụ aka ka a ga-eme ka ọ maa abụba, onye na-emekwa ka ndị ọzọ ṅụjuo mmiri afọ ka a ga-emekwa ka ọ ṅụjuo mmiri afọ.” (Ilu 11:25) N’eziokwu, ị ga-enwekwu obi ụtọ ma i nyere ndị ọzọ aka! *

“Ana m eche otú m ga-esi enyere ndị ọzọ aka, m na-agbalịkwa inyere onye nwere mkpa n’ọgbakọ anyị aka. Imere ndị ọzọ ihe na ịnọnyere ha na-eme m obi ụtọ.”—Breanna.

“Ihe mere ịga ozi ọma ji magbuo onwe ya bụ na ọ na-eme ka mmadụ kwụsị iche maka onwe ya, chewezie maka ndị ọzọ.”—Javon.

Ebe ị ga-akpachara anya: Enyerela ndị ọzọ aka naanị ka i rite ihe n’aka ha. (Matiu 6:2-4) Inyere ndị ọzọ aka n’ihi na ị chọrọ irite ihe n’aka ha agaghị abara gị uru. Ndị mmadụ na-achọpụtakarị na onye na-eme otú ahụ bụ onye ihu abụọ!—1 Ndị Tesalonaịka 2:5, 6.

Ihe ị ga-eme. Gbalịa cheta onye i nyeere aka. Ònye ka ọ bụ, gịnị ka i meere ya?

․․․․․

Olee otú obi dị gị mgbe i mechaara ya ihe ahụ?

․․․․․

Gbalịa cheta onye ọzọ i nwere ike inyere aka, deekwa ihe i nwere ike imere ya.

․․․․․

Nwee Ndị Enyi

Ihe Baịbụl kwuru. “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”—Ilu 17:17.

Ihe ọ pụtara. Ezi enyi nwere ike inyere gị ezigbo aka mgbe nsogbu bịaara gị. (1 Samuel 18:1; 19:2) Obi ga-adị gị mma ma i cheta na e nwere onye hụrụ gị n’anya. (1 Ndị Kọrịnt 16:17, 18) N’ihi ya, ka ndị gị na ha na-akpa bụrụ ndị ga na-eme ka obi dị gị mma.

“Ezigbo ndị enyi ga-agba gị ume mgbe ị dara mbà.”—Donnell.

“Mgbe ụfọdụ, ihe na-akacha mkpa bụ icheta na o nwere onye ihe gbasara gị na-emetụ n’obi. O nwere ike ime ka obi sie gị ike na ị bara uru.”—Heather.

Ebe ị ga-akpachara anya: Na-emeta ndị enyi ga-eme ka ị na-akpa àgwà otú i si akpa, ọ bụghị ndị ọ ga-abụ ị hụ, gị agbanwee otú i si akpa àgwà ka ị dị ka ha. (Ilu 13:20; 18:24; 1 Ndị Kọrịnt 15:33) Ị kpaa àgwà ọjọọ ka ndị ọzọ kpọọ gị ezigbo mmadụ, ọ ga-eme ka obi jọkwuo gị njọ.—Ndị Rom 6:21.

Ihe ị ga-eme. N’okpuru ebe a, dee aha enyi gị ị ma na o nwere ike inyere gị aka ka i nwekwuo obi ike.

․․․․․

Ọ́ gaghị adị mma ma i wepụta oge ka gị na onye ahụ i dere aha ya nọrịa?—Cheta na ọ bụghị iwu na gị na onye ahụ ga-abụ ọgbọ.

Adala Mbà ma I Mejọọ Ihe

Ihe Baịbụl kwuru. “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.”—Ndị Rom 3:23.

Ihe ọ pụtara. Nke bụ́ eziokwu bụ na i zughị okè. Ọ pụtara na mgbe ụfọdụ, ị ga-ekwu ihe ị na-ekwesịghị ikwu ma ọ bụdị mee ihe ị na-ekwesịghị ime. (Ndị Rom 7:21-23; Jems 3:2) O nweghị ihe ga-eme ka ị ghara imejọ ihe ụfọdụ, ma nwere ike ime ka ihe i mejọrọ ghara iwutebiga gị ókè. Baịbụl sịrị: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.”—Ilu 24:16.

“Mgbe ụfọdụ, ihe na-eme ka mmadụ chee na ya abaghị uru bụ iji ihe ọ na-emejọ na-atụnyere ihe onye ọzọ na-emeta.”—Kevin.

“Onye ọ bụla nwere ihe ọ na-emeta na ihe ọ na-adịghị emeta. Ihe anyị na-emeta kwesịrị ime anyị obi ụtọ, anyị ana-agbalị imezi ihe anyị na-emejọ.”—Lauren.

Ebe ị ga-akpachara anya: Akpacharala anya na-eme mmehie, na-asị na ọ bụ n’ihi ezughị okè. (Ndị Galeshia 5:13) Ịkpachara anya na-eme mmehie ga-eme ka gị na Jehova Chineke ghara ịdị ná mma, bụ́ onye adịm ná mma gị na ya kacha dịrị mkpa!—Ndị Hibru 10:26, 27.

Ihe ị ga-eme. N’okpuru ebe a, dee otu àgwà ị chọrọ ịna-emekwu nke ọma na ya.

․․․․․

N’akụkụ ebe i dere àgwà ahụ, dee ụbọchị i dere ya. Chọpụta otú ị ga-esi mekwuo nke ọma na ya. Otu ọnwa gaa, tụlee otú ị gbalịruru.

Ị Bara Ezigbo Uru

Baịbụl kwuru na “Chineke karịrị obi anyị.” (1 Jọn 3:20) Ọ pụtara na Chineke na-ahụ uru ị bara ọ bụrụgodị na i chere na ị baghị uru. Ma ezughị okè gị ọ̀ ga-agbanwe otú Chineke si ele gị anya? Weregodị ya na i nwere otu puku naịra dọkatụrụ adọka. Ị̀ ga-atụfu ya ma ọ bụ were na ọ baghịzi uru n’ihi ebe ahụ dọkatụrụ adọka? Mbanụ! Ọ ka bụkwa otu puku naịra, ma ọ̀ dọkatụrụ adọka ma ọ bụ na ọ dọkaghị.

Otú ahụ ka Chineke si were gị. Ihe ị na-emejọ agaghị eme ka o chee na ị baghị uru. Ọ na-ahụ mbọ ị na-agba ime ihe dị ya mma, o jikwa ya kpọrọ ihe, ọ bụrụgodị na i chere na o nweghị ihe ọ bụ! N’eziokwu, Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ [anyị] na ịhụnanya [anyị] gosiri maka aha ya.”—Ndị Hibru 6:10.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ò nwere mgbe ụfọdụ obi na-anaghị adịtụdị gị mma? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị ga-eme?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 21 Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, chegodị ụdị obi ụtọ ị ga-enwe ma ị na-ezi ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke.—Aịzaya 52:7.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya, mgbe ahụkwa ọ ga-enwe aṅụrị n’ọrụ ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye ọzọ.”—Ndị Galeshia 6:4.

NDỤMỌDỤ

Echela, sị, ‘M na-emejọ ihe mgbe niile’ ma ọ bụ ‘O nweghị ihe m na-emeta.’ Iche otú ahụ ga-eme ka ị daa mbà. Kama iche otú ahụ, mata ihe ndị ị na-anaghị emeta, ma echefula ihe ndị ị na-emeta.

Ị̀ MA NA . . . ?

Otú i si ele onwe gị anya ka ndị ọzọ nwere ike isi na-ele gị anya . . . ma na-emeso gị.

IHE M GA-EME!

Ndị ọgbọ m katọwa m, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

M chọpụta na m na-ahụkarị ihe m mejọrọ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị nwere ike ime ka obi ghara ịna-esi ndị na-eto eto ike?

● Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị ghọta na ị bara uru?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 88]

“Mmadụ nwere ike ịma ezigbo mma, ma ya adị ya ka ọ̀ jọrọ njọ. Onye na-amachaghị mma nwere ike iche na ọ bụ ya kacha mma n’ụwa a. Ihe dị mkpa bụ otú i si ele ihe anya.”—Alyssa

[Foto dị na peeji nke 90]

Ego ka na-aba uru n’agbanyeghị na ọ dọkatụrụ adọka. Otú ahụ ka gịnwa bakwara uru n’anya Chineke n’agbanyeghị na i zughị okè