Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Obi Kwụsị Ịna-ajọkarị M Njọ?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Obi Kwụsị Ịna-ajọkarị M Njọ?

ISI NKE 13

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Obi Kwụsị Ịna-ajọkarị M Njọ?

“Ndị enyi m nwee nsogbu gbara ha gharịị, m na-agwa ha otú ha ga-esi merie ya, nke na-eme ka obi dị ha mma. Ma ọtụtụ ndị amaghị na ọ na-abụ m laa, mụ ebewe ákwá n’ihi nsogbu ndị m nwere.”—Kellie.

“Mgbe obi na-adịghị mụ mma, m na-anọrọ onwe m. Mmadụ sị m bịa na nke ya, mụ achọta ihe m ga-agwa ya mere na agaghị m abịa. Anaghị m eme ka ndị ezinụlọ anyị mara na obi adịghị mụ mma. Ha na-eche na mụ enweghị nsogbu.”—Rick.

Ọ̀ DỊTỤLA gị otú ahụ ọ dị Kellie ma ọ bụ Rick? Ọ bụrụ otú ahụ, echela na e nwere ihe na-eme gị. N’eziokwu, onye ọ bụla nwere mgbe obi na-ajọ ya njọ. Otú ahụ ka ọ dị ndị fere Chineke n’oge Baịbụl.—1 Samuel 1:6-8; Abụ Ọma 35:14.

Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịma ihe mere obi ji ajọ gị njọ; mgbe ụfọdụkwa, ị gaghị ama. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Ana kwuru, sị: “Ọ bụghị naanị mgbe oké ihe ọjọọ mere ka obi na-ajọ mmadụ njọ. Obi nwere ike ịjọ mmadụ njọ mgbe ọ bụla, ọ bụrụgodị na onye ahụ enweghị nsogbu ọ bụla. Ụdị ihe ahụ na-eju m anya, ma ọ na-eme eme!”

Ma è nwere ihe mere obi ji ajọ gị njọ ma ọ bụ na e nweghị, gịnị ka i nwere ike ime ma obi jọwa gị njọ? Megodị ihe ndị a:

1. Kọọrọ onye ọzọ. Mgbe oké nsogbu bịaara Job, o kwuru, sị: “M ga-ekwu okwu dị ka o si ewute mkpụrụ obi m!”—Job 10:1.

Kellie kwuru, sị: “Otú obi si eru m ala ma m kọchaara onye ọzọ otú obi dị m na-atọ m ụtọ. Onye ọzọ emechaala mata ihe mụ na ya na-alụ. Ọ na-adị m ka onye ahụ ò ji ụdọ dọpụta m n’olulu m dabara na ya!”

Aro: N’okpuru ebe a, dee aha enyi gị i nwere ike ịkọrọ otú obi dị gị ma obi jọwa gị njọ.

․․․․․

2. Dee otú obi dị gị. Ọ bụrụ na ike ụwa na-agwụ gị n’ihi na obi na-ajọ gị njọ, i nwere ike ide otú obi dị gị n’akwụkwọ. N’abụ ọma ụfọdụ Devid dere n’ike mmụọ nsọ, o kwuru otú ihe si wute ya. (Abụ Ọma 6:6) Ide otú obi dị gị nwere ike inyere gị aka ‘ichekwa ezi amamihe na ikike iche echiche.’—Ilu 3:21.

Heather kwuru, sị: “Mgbe obi na-adịghị mụ mma, isi na-agba m ghara ghara. Ma ide otú obi dị m na-eme ka obi kpakọọ m ọnụ. I dechaa otú obi dị gị ma ghọta ihe mere obi ji jọọ gị njọ, obi nwere ike ịdịtụ gị mma.”

Aro: Lee anya na chaatị dị na  peeji nke 93 ka o nyere gị aka icheta ụzọ ka mma ị ga-esi merie nsogbu ndị bịaara gị. Ọ ga-eme ka obi dịtụ gị mma.

3. Kpee ekpere. Baịbụl kwuru na i kpee ekpere banyere ihe na-echu gị ụra, ‘udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi gị na ike iche echiche gị nche.’—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Esta kwuru, sị: “Agbalịrị m ịchọpụta ihe mere obi ji ajọkarị m njọ, ma o kweghị m. Arịọrọ m Jehova ka o nyere m aka inwe obi ụtọ. Obi ịjọ m njọ mgbe m na-amaghị ihe kpatara ya gwụrụ m ike. Ekpere ahụ m kpere nyere aka mee ka obi na-adị mụ mma. Echela na ekpere abachaghị uru!”

Aro: Gụọ Abụ Ọma 139:23, 24 ka ị hụ ihe i nwere ike ịrịọ Jehova n’ekpere. Gwa Jehova otú obi dị gị, rịọkwa ya ka o nyere gị aka ịchọpụta ihe mere obi ji ajọ gị njọ.

Ihe ọzọ nwere ike inyere gị aka bụ ndụmọdụ bara uru ndị dị n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl. Ịgụ ihe ndị na-agba ume e kwuru na Baịbụl nwere ike inyere gị aka ime ka obi dị gị mma. (Abụ Ọma 1:1-3) Ị gụọ peeji ndị ahụ e dere “Onye M Ga-eṅomi” n’akwụkwọ a nakwa na nwanne ya bụ́ Nke 2, ị ga-ahụ ihe ụfọdụ nwere ike ime ka ọgụgụ Baịbụl gị gbaa gị ume. Na peeji nke 227 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2, ị ga-ahụ otú Pọl onyeozi si merie nsogbu ọ na-enwe, nke bụ́ obi ịjọ ya njọ mgbe ụfọdụ n’ihi ihe ndị ọ na-adịghị emeta.

Ọ Bụrụ na Obi Na-ajọ Gị Njọ Ekweghị Akwụsị

Ryan kwuru, sị: “N’ụtụtụ ụfọdụ, ọ na-adị m ka ọ̀ kaara mụ mma idina ebe m dina ka m ghara ibili ebili n’ihi na m weere na ndụ m enweghị isi na ọdụ.” Obi jọwa Ryan njọ, ọ na-adịte aka. Ụdị obi ịjọ njọ a bụ ọrịa. E nwekwara ọtụtụ ndị na-arịa ya. Nchọpụta e mere gosiri na e kee ndị na-eto eto ụzọ anọ, ihe dị ka otu ụzọ na-arịa ụdị ọrịa a tupu ha etoruo dimkpa.

Olee otú ị ga-esi mara ma nke gị ọ̀ bụ ọrịa? Ihe ụfọdụ e ji ama onye nke ya bụ ọrịa bụ na àgwà onye ahụ ga-agbanwe, ya ana-ewekarị iwe, na-anọkarị naanị ya. O nweghị ihe ọ ga na-achọ ime. Ọ gaghị na-eri nri otú ọ na-eribu. Ọ gaghịkwa na-ehi ụra otú ọ na-ehibu. Obi ga na-amakarị ya ikpe ma ọ bụ ya ana-eche na ya abaghị uru.

N’eziokwu, ụdị ihe ahụ nwere ike ime onye ọ bụla mgbe ụfọdụ. Ma ọ bụrụ na o mee gị karịa izu ole na ole n’akwụsịghị akwụsị, ọ ga-adị mma ka ị gwa ndị mụrụ gị na ị chọrọ ịga hụ dọkịta. Dọkịta nwere ike inyere gị aka ịchọpụta ma otú ahụ obi na-adị gị ọ̀ bụ ọrịa. *

Ọ bụrụ na o nweghị mgbe obi na-adị gị mma, o nwere ike ịbụ ọrịa. Ma o kwesịghị imewe gị ihere. Ịga ụlọ ọgwụ emeela ka ahụ́ dịtụ ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa a mma karịa otú ọ dịtụrụla ha kemgbe ọtụtụ afọ! Ma otú obi si ajọ gị njọ ọ̀ bụ ọrịa ma ọ bụ na ọ bụghị, cheta ihe na-akasi obi e kwuru n’Abụ Ọma 34:18, nke bụ́, “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na obi na-ajọ gị njọ mgbe niile mere ka i chewe echiche igbu onwe gị?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 22 Ụfọdụ ndị na-eto eto na-eche echiche igbu onwe ha ma ọ bụrụ na obi adịghị ha mma ruo ogologo oge. Ọ bụrụ na i chetụla echiche igbu onwe gị, egbula oge ịkọrọ ya onye toro eto ị tụkwasịrị obi.—Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 14 n’akwụkwọ a.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18.

NDỤMỌDỤ

Dee otú ọ na-adị gị mgbe obi na-adịghị gị mma nakwa ihe i chere kpatara ya. Otu ọnwa gafee, gụọ ihe i dere. Otú i si ele ihe ahụ anya ọ̀ gbanweela? Ọ bụrụ otú ahụ, dee ihe nyeere gị aka.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ibe ákwá adịghị njọ, ọ bụrụgodị na ị bụ nwoke. O nwere oge Eze Devid kwuru, sị: “M na-eme ka ihe ndina m jupụta n’anya mmiri m.”—Abụ Ọma 6:6.

IHE M GA-EME!

Ihe ndị m ga-eme ka obi dị mụ mma bụ: ․․․․․

Ndị enyi m mụ na ha ga na-akpa ka ha nyere m aka ka obi dị mụ mma bụ: ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Ibe ákwá ọ̀ bara uru?

● Mgbe obi na-adịghị gị mma, olee otú gị na ndị ọzọ ịnọ ga-esi mee ka obi dịtụ gị mma?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 96]

“Mgbe obi na-adịghị mụ mma, m na-agbalị ka m ghara ịnọ naanị m. Ama m na m kwesịrị ịnọ naanị m mgbe ụfọdụ ka m chebara onwe m echiche ma ọ bụ bee ezigbo ákwá. Ma e mechaa, ama m na m kwesịrị ịnọ ebe ndị ọzọ nọ ka m nwee ike iwepụ obi n’ihe mere obi ji jọọ m njọ.”—Christine

[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke 93]

 Ebe M Dere Ihe

Ime Ka Obi Dịtụ Gị Mma

Dee ihe n’ebe a

Ihe merenụ

Onye nkụzi na-eme ka m chee na mụ abaghị uru

Ihe ị na-ekwesịghị ime

M ga-akwụsị ịgbalị ime nke ọma n’ihe ọ na-akụzi

Ihe i kwesịrị ime

Aro: Gụọ Isi nke 20 n’akwụkwọ a

Ihe merenụ

Enyi m anaghịzi atụpụrụ m ọnụ

Ihe ị na-ekwesịghị ime

Iji onye ahụ gbaa asịrị

Ihe i kwesịrị ime

Aro: Gụọ Isi nke 10 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2

Ihe merenụ

Ndị mụrụ m chọrọ ịgba alụkwaghịm

Ihe ị na-ekwesịghị ime

Iburu otu n’ime ha ma ọ bụ ha abụọ iwe n’obi

Ihe i kwesịrị ime

Aro: Gụọ Isi nke 4 n’akwụkwọ a

Ihe merenụ

․․․․․

Ihe ị na-ekwesịghị ime

․․․․․

Ihe i kwesịrị ime

․․․․․

Ihe merenụ

․․․․․

Ihe ị na-ekwesịghị ime

․․․․․

Ihe i kwesịrị ime

․․․․․

[Foto dị na peeji nke 95]

Onye obi na-ajọkarị njọ yiri onye nọ n’olulu. O nwere ike ịpụta ma e nyere ya aka, ya agbalịsiekwa ike