Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ́ Gaghị Akara Mụ Mma Igbu Onwe M?

Ọ́ Gaghị Akara Mụ Mma Igbu Onwe M?

ISI NKE 14

Ọ́ Gaghị Akara Mụ Mma Igbu Onwe M?

“Ọ KAARA m mma ịnwụ anwụ karịa na m dị ndụ.” Ònye kwuru ihe ahụ? Ọ̀ bụ onye na-ekweghị na Chineke? Ọ̀ bụ onye na-anaghịzi efe Chineke? Ọ̀ bụ onye Chineke jụrụ ajụ? Mbanụ. Onye kwuru ya bụ otu nwoke na-efesi Chineke ike, onye ihe na-ewute n’obi. Aha ya bụ Jona.—Jona 4:3.

Baịbụl ekwughị na Jona chọrọ igbu onwe ya. Ma, ihe ahụ ọ rịọrọ mere ka otu ihe dị oké mkpa doo anya, nke bụ́ na mgbe ụfọdụ, nhụjuanya nwere ike ime ka ike ụwa gwụ onye na-efe Chineke.—Abụ Ọma 34:19.

Nsogbu tara akpụ na-eme ka ụfọdụ ndị na-eto eto chee na ọ kaara ha mma igbu onwe ha. O nwere ike ịdị ha otú ọ dị otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Laura, bụ́ onye sịrị: “Kemgbe ọtụtụ afọ, ike ụwa na-agwụ m ọtụtụ mgbe. Ihe na-abatakarị m n’obi bụ igbu onwe m.” Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ị ma ekwuo na ya ga-egbu onwe ya ma ọ bụkwanụ na gịnwa chọrọ igbu onwe gị? Ka anyị tụlee ihe nwere ike ime ka mmadụ chewe echiche igbu onwe ya.

Ihe Mere Ike Ụwa Ji Agwụ Ha

Gịnị mere mmadụ ga-eji chewe echiche igbu onwe ya? E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịkpata ya. Otu bụ na anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ.’ Ihe isi ike na-akpakwa ndị na-eto eto aka ọjọọ. (2 Timoti 3:1) Ezughị okè nwere ike ime ka ụfọdụ ndị na-eche ihe ọjọọ banyere onwe ha nakwa ihe na-eme n’ụwa a. (Ndị Rom 7:22-24) Ihe na-akpata ya mgbe ụfọdụ bụ arụrụala a rụsara ha. Mgbe ụfọdụ, ọrịa nwekwara ike ịkpata ya. N’otu mba, a chọpụtara na ihe dị ka mmadụ itoolu n’ime mmadụ iri ọ bụla gburu onwe ha nwere isi mgbaka. *

N’eziokwu, o nweghị onye nsogbu na-anaghị abịara. Baịbụl kwuru na “ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) A gụpụghị ndị na-eto eto. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụdị nsogbu ndị e dere n’okpuru ebe a nwere ike ịkpa ndị na-eto eto aka ọjọọ:

Ọnwụ onye ikwu ma ọ bụ enyi

Esemokwu ezinụlọ

Emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ

Mgbe onye chọrọ ịlụ mmadụ tiwara ya obi

Arụrụala (iti mmadụ ihe, idina mmadụ n’ike ma ọ bụ ihe yiri ya)

N’eziokwu, ụdị nsogbu ndị ahụ nwere ike ịbịara onye ọ bụla na-eto eto. Gịnị mere o ji adịrị ụfọdụ ndị mfe idi nsogbu ndị a karịa ndị ọzọ? Ndị ọkachamara sịrị na ndị na-eto eto na-anaghị edili nsogbu ha na-eche na o nweghị onye nwere ike inyere ha aka nakwa na nsogbu ha enweghị ngwọta. E nwere ike ikwu na ha na-eche na olileanya adịghị. Ọ bụghị na ha chọrọ ịnwụ kama ha chọrọ ka nsogbu ha kwụsị.

Ọ̀ Bụ na Olileanya Adịghị?

Ma eleghị anya, ị ma onye chọrọ ka nsogbu ya kwụsị, nke mere ka o kwuo na ya achọghịzi ịdị ndụ. Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị ga-eme?

Enyi gị kwuo na ya chọrọ ịnwụ n’ihi na obi adịghị ya mma, gbaa ya ume ka ọ chọọ onye ga-enyere ya aka. Ma ò kwere ma ọ bụ na o kweghị, kọọrọ ya onye toro eto ma ihe. Atụla ụjọ na unu agaghịzi adị ná mma. Ị kọọrọ ya onye ọzọ, o nwere ike ime ka enyi gị ahụ ghara igbu onwe ya!

Ọ́ bụrụkwanụ na ọ bụ gị chọrọ igbu onwe gị? Agbala nkịtị. Kọọrọ ya mama gị ma ọ bụ papa gị, enyi gị ma ọ bụ onye ọzọ hụrụ gị n’anya, bụ́ onye ga-ege gị ntị, jirikwa ihe ị gwara ya kpọrọ ihe. Ị gwa onye ọzọ nsogbu i nwere, ọ ga-abara gị ezigbo uru. O nweghị ihe ọ ga-ewepụ gị n’ahụ́. *

Ọ bụ eziokwu na nsogbu gị agaghị akwụsị naanị n’ihi na ị kọọrọ ya ndị ọzọ. Ma ịkọrọ ya onye ị tụkwasịrị obi nwere ike inyere gị aka ịma otú i kwesịrị isi na-ele nsogbu ahụ anya. O nwedịrị ike inyere gị aka ịma ihe i kwesịrị ime ka nsogbu gị kwụsị.

Ihe Na-agbanwe Agbanwe

Mgbe nsogbu bịaara gị, cheta na n’agbanyeghị otú ihe siruru ike, ihe ga-emecha gbanwee. Ọbụ abụ bụ́ Devid nwere nsogbu ọtụtụ ugboro. Ma o nwere mgbe ọ gwara Chineke n’ekpere, sị: “Ị gbanwewo iru uju m ka ọ bụrụ ịgba egwú.”—Abụ Ọma 30:11.

Ma Devid ebughị n’obi na ọ ga na-agba egwú ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ihe ndị mere ya mere ka ọ mata na nsogbu bịaara mmadụ ga-emecha laa. Ị̀ chọpụtala na nsogbu ndị na-abịara gị na-emecha laa? Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịdị gị ugbu a ka hà akarịala. Ma, nwee ndidi. Ihe na-agbanwe agbanwe, kakwa mma. Mgbe ụfọdụ, nsogbu nwere ike ibelata otú ị na-atụghị anya ya. Mgbe ụfọdụ, i nwekwara ike icheta otú ị ga-esi die nsogbu gị. Mara na nsogbu na-echu gị ụra agaghị adị otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi.—2 Ndị Kọrịnt 4:17.

Uru Ekpere Bara

Ekpere bụ ụzọ kacha mkpa i nwere ike isi kwuo banyere nsogbu gị. I nwere ike ikpe ekpere ka Devid, bụ́ onye rịọrọ Jehova, sị: “Chineke, biko, nyochaa m, marakwa obi m. Nyochaa m, marakwa nchegbu m, lee ma m̀ na-eje ije n’ụzọ ọ bụla nke na-eweta ihe mgbu, na-edukwa m n’ụzọ nke mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 139:23, 24.

Ekpere abụghị mkpara mmadụ ji enyere onwe ya aka. Ọ bụ otú i si agwa Nna gị nke eluigwe okwu. Chineke chọrọ ka ị ‘wụpụrụ ya obi gị.’ (Abụ Ọma 62:8) Tụlee eziokwu ndị dị mkpa banyere Chineke:

Ọ ma ihe ndị na-eme ka obi jọọ gị njọ.—Abụ Ọma 103:14.

Ọ ma gị karịa ka ị ma onwe gị.—1 Jọn 3:20.

“Ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:7.

N’ụwa ọhụrụ, Chineke ‘ga-ehichapụ anya mmiri niile’ n’anya gị.—Mkpughe 21:4.

Ọ Bụrụ na Nsogbu Gị Bụ Ọrịa

Dị ka anyị bu ụzọ kwuo, ọ bụ isi mgbaka na-emekarị ka ndị mmadụ chewe echiche igbu onwe ha. Ọ bụrụ na i chere na ọ dị gị otú ahụ, emela ihere ịchọ enyemaka. Jizọs kwuru na ndị ọrịa kwesịrị ịgakwuru ọgwọ ọrịa. (Matiu 9:12) Ọ dị mma na ọtụtụ ọrịa nwere ọgwụ e ji agwọ ha. Ịṅụ ọgwụ nwere ike ime ka ahụ́ gị ka mma! *

Baịbụl kwere nkwa na-akasi obi na “ọ dịghị onye bi [n’ụwa ọhụrụ Chineke] nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’” (Aịzaya 33:24) Chineke kwuru na n’oge ahụ, “a gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.” (Aịzaya 65:17) Ka ọ dị ugbu a, na-eme ihe ọ bụla i nwere ike ime iji na-edi nsogbu ndị bịaara gị, ka obi siekwa gị ike na mgbe oge ruru, Chineke ga-ewepụ ịda mbà n’obi.—Mkpughe 21:1-4.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A N’ISI NKE 9 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ka e were ya na ndị mụrụ gị na-achọ ịma ihe niile ị na-eme, ma ihe ndị ị na-achọghị ka ha mara. Ì nwere ike ime ka ha na-ahapụtụ gị aka?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ma, e kwesịrị iburu n’obi na ọtụtụ n’ime ndị na-eto eto nwere isi mgbaka anaghị egbu onwe ha.

^ par. 18 Ndị Kraịst nwee nsogbu, ndị ọzọ ha nwere ike ịkọrọ ya bụ ndị okenye ọgbakọ.—Jems 5:14, 15.

^ par. 31 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 13 n’akwụkwọ a.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

NDỤMỌDỤ

Mgbe obi na-adịghị gị mma, pụọ n’èzí gagharịtụ. Ịpụ n’èzí na imega ahụ́ nwere ike ime ka obi dị gị mma, ruokwa gị ala.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ndị gburu onwe ha mere onwe ha ihe ọjọọ, meekwa ndị hụrụ ha n’anya ha hapụrụ nwụọ.

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na ọ́ dị m ka mụ abaghị uru nakwa na a kpọrọ m asị, onye m ga-agwa otú obi dị m bụ (dee aha onye ị tụkwasịrị obi) ․․․․․

Ihe ọma meere m nke m ga na-atụgharị n’uche bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Nsogbu ndị siri ezigbo ike ga-emecha laa. Olee otú ichebara ihe a echiche nwere ike isi nyere gị aka?

● Olee otú mmadụ igbu onwe ya ga-esi mee ka nsogbu ya gafeere onye ọzọ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 104]

“Mgbe ụfọdụ, obi na-ajọ mụ njọ nke na ọ na-adị m ka m gbuo onwe m. Ma ugbu a, enwetala m onwe m n’ihi na o nweghị mgbe m kwụsịrị ikpe ekpere na ịga na-anara ọgwụ.”—Heidi

[Igbe dị na peeji nke 100]

Ọ Bụrụ Na Ọ Dị Gị Ka Nsogbu Ọ̀ Karịala

Mgbe ụfọdụ, ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Baịbụl, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, nwere mgbe ọ dị ha ka nsogbu ha ọ̀ karịala. Tụlee ụfọdụ n’ime ha.

Ribeka kwuru, sị: “Ọ bụrụ otú a ka ọ dị, gịnị medịrị m ji dịrị ndụ?”—Jenesis 25:22.

Mozis kwuru, sị: “Biko, gbuo m ka m nwụọ, . . . ka m ghara ịhụ ọdachi ga-adakwasị m.”—Ọnụ Ọgụgụ 11:15.

Ịlaịja kwuru, sị: “Jehova, wepụ mkpụrụ obi m, n’ihi na akaghị m nna nna m hà mma.”—1 Ndị Eze 19:4.

Job kwuru, sị: “A sị nnọọ na ị ga-ezobe m na Shiol, . . . na ị ga-ekpebi oge m ga-anọru, i wee cheta m!”—Job 14:13.

Ihe mechara dịrị ha niile mma otú ha na-atụghị anya ya. Ka obi sie gị ike na ụdị ihe ahụ nwere ike imere gị!

[Foto dị na peeji nke 102]

Ịda mbà n’obi yiri mgbe mmiri na-eru. Obi ga-emecha dị gị mma, dịkwa ka elu na-emecha gbachaa