Ọ̀ Dị Njọ Izo Ihe Ụfọdụ M Na-eme Ezo?
ISI NKE 15
Ọ̀ Dị Njọ Izo Ihe Ụfọdụ M Na-eme Ezo?
N’ihe ndị a e kwuru ebe a, kanye ✔ na nke i nwere ike ikwu ma ụdị ihe ahụ mee:
1. Ị nọ n’ime ụlọ gị, mechie ụzọ, nwanne gị agbabata n’ebughị ụzọ kụọ aka.
□ ‘Nsogbu adịghị. Ana m emekwa nwanne m ụdị ihe ahụ.’
□ ‘Ihe a bụ mkparị! Ọ́ bụrụkwanụ na m na-eyiri uwe?’
2. I si esi bata, ndị mụrụ gị amalite ịjụkasị gị ajụjụ ahụ́. “Ị̀ gara ebee? Ị̀ gara ime gịnị? Gị na ole ndị?”
□ ‘Nsogbu adịghị. O nweghị ihe m na-anaghị akọrọ ha.’
□ ‘Ọ na-ewe m iwe! Ha atụkwasịghị m obi!’
MGBE ị bụ nwata, o nwere ike ị naghị ezo ihe ọ bụla ezo. Ọ bụrụ na nwanne gị ị tọrọ agbabata n’ime ụlọ gị n’ebughị ụzọ kụọ aka, ọ naghị ewe gị iwe. Ndị mụrụ gị jụọ gị ajụjụ, ị naghị egbu oge aza ya. N’oge ahụ, onye ọ bụla ma ihe niile ị na-eme. Ma ugbu a, ị naghị achọ ka mmadụ mara ihe ụfọdụ ị na-eme. Otu nwata nwoke dị afọ iri na anọ aha ya bụ Andru sịrị: “Obi na-adị m ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ọzọ amaghị ihe ụfọdụ m na-eme.” Ka anyị leba anya n’ihe abụọ nwere ike isere unu okwu mgbe ị na-ezo ihe ụfọdụ ezo.
Mgbe Ị Chọrọ Ịnọ Naanị Gị
E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka ị chọọ ịnọ naanị gị. O nwere ike ịbụ na ị chọrọ ‘izurutụ ike.’ (Mak 6:31) Ị chọọkwa ikpe ekpere, i nwere ike ‘ịbanye n’ọnụ ụlọ gị, mechie ọnụ ụzọ gị, kpekuo Nna gị ekpere’ otú ahụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme. (Matiu 6:6; Mak 1:35) Ma nsogbu bụ na, ọ bụrụ na i nwere ọnụ ụlọ nke gị, ị banye na ya mechie ụzọ, o nwere ike ndị mụrụ gị agaghị ama na ị na-ekpe ekpere! O nwekwara ike ụmụnne gị agaghị aghọta na ị chọrọ ịnọ naanị gị.
Ihe i nwere ike ime. Kama ikwe ka o sewere gị na ha okwu, mee ihe ndị a:
● Ọ bụrụ okwu gị na ụmụnne gị, gbalịa jiri obiọma gwa ha ihe ị chọrọ ka ha ghara ịna-eme, nke ga-eme ka i nwee ike ịnọrọ naanị gị mgbe ụfọdụ. I nwedịrị ike ịgwa ndị mụrụ gị ka ha nyere gị aka. *
● Ọ bụrụ okwu gị na ndị mụrụ gị, gbalịa ghọta otú ha si ele ihe anya. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Ribeka sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ndị mụrụ m na-achọ ịma ihe m na-eme. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na, m bụrụ nne nwere nwa dị afọ iri na ụma, m ga-eme ihe ahụ ndị mụrụ m na-eme, nke ka nke n’ihi ọtụtụ ọnwụnwa na-abịara ndị na-eto eto n’oge a!” Dị ka Ribeka, ì nwere ike ịghọta ihe mere ndị mụrụ gị ji achọ ịmata ihe ị na-eme?—Ilu 19:11.
● Jụọ onwe gị, sị: ‘M nọrọ n’ime ụlọ m gbachie ụzọ, m̀ na-eme ihe ga-eme ka ndị mụrụ m chewe na m na-eme ihe na-adịghị mma? M̀ na-ezokarị ihe m na-eme ezo, nke mere ka ha chọwa otú ha ga-esi jiri akọ mata ihe Jems 1:19.
m na-eme?’ Ọ bụrụ na ị zara ‘mba’ n’ajụjụ ndị ahụ, ma ya adị gị ka ndị mụrụ gị hà na-enyo gị enyo, wetuo obi gwa ha otú obi dị gị. Gee ha ntị nke ọma mgbe ha na-agwa gị ihe bụ́ ụjọ ha. Gbalịsiekwa ike ka ị ghara ime ihe ọ bụla ga-eme ka ha na-enyo gị enyo.—Mgbe Ị Chọrọ Imeta Ndị Enyi
Mgbe ị na-eto, ọ dịghị njọ imeta ndị na-abụghị ndị ezinụlọ unu enyi. Ọ dịghịkwa njọ ma ndị mụrụ gị chọọ ịma ndị bụ́ ndị enyi gị nakwa ihe ị na-eme mgbe gị na ha nọ. Ma o nwere ike ịdị gị mgbe ụfọdụ ka hà na-enye onwe ha nsogbu na-enweghị isi. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Amy sịrị: “Achọghị m ka ndị mụrụ m na-ajụkarị m onye mụ na ya na-ekwu n’ekwe ntị ma ọ bụ onye ziteere m ozi iimel.”
Ihe i nwere ike ime. Kama ikwe ka ndị i metara enyi na-esere gị na ndị mụrụ gị okwu, gbalịa mee ihe ndị a:
● Ezola ndị bụ́ ndị enyi gị ezo. Mee ka ndị mụrụ gị mara ha. A sị ka e kwuwe, ị gaghị achọ ka ndị mụrụ gị si n’azụ mata ndị enyi gị. Ma ha ga-eme otú ahụ ma ọ bụrụ na ị naghị agwa ha ndị bụ́ ndị enyi gị. Cheta na, ndị mụrụ gị mata ndị gị na ha na-akpa, o nwere ike ime ka obi sikwuo ha ike na ndị enyi gị abụghị ndị ọjọọ.
● Gwa onwe gị eziokwu: Ọ̀ bụ naanị na ị chọghị ka e nyewe gị nsogbu, ka è nwere ihe ị na-ezo ezo? Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Brittany kwuru, sị: “Ọ bụrụ na gị na ndị mụrụ gị bi, e nweekwa ihe ị na-eme na-echu ha ụra, ihe i kwesịrị iche bụ, ‘Ihe m na-eme
adịghị njọ, gịnịzi mere m ga-eji na-ezo ya ezo?’ Ma, ọ bụrụ na ị na-ezo ya ezo, mara na ihe ị na-eme adịghị mma.”Ihe I Kwesịrị Ime ma E Nwee Ihe Ị Na-ezo Ezo
Ugbu a, i nwere ike icheta ihe ị ga-eme ná nsogbu ọ bụla na-echu gị ụra, nke gbasara ihe ị na-ezo ezo. N’okpuru ebe a, dee ihe ị ga-aza n’ajụjụ ndị e dere n’akụkụ ihe ndị i kwesịrị ime:
Nke 1: Chọpụta ihe bụ́ nsogbu. Olee ihe gbasara gị ị na-achọghị ka ndị mụrụ gị mata?
․․․․․
Nke 2: Chọpụta ihe na-echu ha ụra. Gịnị ka i chere mere ihe ahụ ji echu ha ụra?
․․․․․
Nke 3: Gbalịa dozie nsogbu ahụ. Olee ihe ị na-eme n’amaghị ama nke nwere ike iso na-eme ka nsogbu ahụ ka njọ? Gịnị ka i nwere ike ime ka nsogbu ahụ kwụsị? Gịnị ka ị chọrọ ka ndị mụrụ gị mee n’ihi ihe ndị ahụ na-echu gị ụra?
․․․․․
Nke 4: Gwa ha otú obi dị gị. Dee ihe mbụ i nwere ike ikwu mgbe ị chọrọ ịgwa ndị mụrụ gị banyere ihe ị na-ezo ezo.
․․․․․
Papa gị ma ọ bụ mama gị ọ̀ nwụọla? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị nwere ike ịkasi gị obi?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
AMAOKWU BAỊBỤL
“Gbalịsie ike ka i chee onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye ihe ya dị ya mma, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere.”—2 Timoti 2:15.
NDỤMỌDỤ
Mgbe ị na-agwa ndị mụrụ gị ihe ụfọdụ ị na-ezo ezo, ejila iwe ekwu ya. Wetuo obi kwuo ihe na-echu gị ụra. Gịnị mere i ji kwesị ime otú ahụ? Iji iwe ekwu okwu ga-eme ka i kwuo ihe i chere papa gị na mama gị na-emejọ. Iwetu obi kwuo okwu ga-enyere gị na ha aka ịmata ihe a ga-eme ka nsogbu ahụ bie.
Ị̀ MA NA . . . ?
Ọ bụrụ na ị na-agwa ndị mụrụ gị eziokwu, ọ ga-eme ka ha ghara ịna-enyo gị enyo.
IHE M GA-EME!
Ihe m ga-eme ka ndị mụrụ m na-atụkwasị m obi bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Gịnị mere o ji bụrụ na ndị mụrụ gị kwesịrị ịchọ ịma ihe ị na-eme?
● Olee otú mgbalị ị na-eme iji mụta otú gị na ndị mụrụ gị ga-esi na-akparịta ụka nwere ike isi nyere gị aka ịma otú gị na ndị ọzọ torola eto ga-esi na-akparịta ụka ma i too?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 108]
“Ndị mụrụ gị achọghị ka ihe ọ bụla mee gị, o nwere ike ịdị gị mgbe ụfọdụ ka hà chọrọ ịma ihe ọ bụla ị na-eme, gị echee na ihe ha na-eme adịghị mma. Ma n’eziokwu, ọ bụrụ na m bụ nne ma ọ bụ nna, m nwere ike ime ụdị ihe ahụ.”—Alana
[Foto dị na peeji nke 109]
Ị rụọ ọrụ, a kwụọ gị ụgwọ. I mee ihe ọma, a tụkwasị gị obi