Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ụjọ Ji Atụ M n’Ụlọ Akwụkwọ Ịgwa Ndị Ọzọ Ihe M Kweere?

Gịnị Mere Ụjọ Ji Atụ M n’Ụlọ Akwụkwọ Ịgwa Ndị Ọzọ Ihe M Kweere?

ISI NKE 17

Gịnị Mere Ụjọ Ji Atụ M n’Ụlọ Akwụkwọ Ịgwa Ndị Ọzọ Ihe M Kweere?

“N’ụlọ akwụkwọ anyị, e nweela ọtụtụ mgbe m kwesịrị ịgwa ndị ọzọ ihe m kweere. Ma o nweghị mgbe ọ bụla m kwuru okwu.”—Kaleb.

“Otu ụbọchị anyị nọ na klas, onye nkụzi anyị jụrụ anyị ihe anyị chere banyere ozizi evolushọn. Ama m na ọ bụ oge m kwesịrị iji kwuo ihe m kweere. Ma m nọ na-ele shii n’ekwughị ihe ọ bụla. O mechara wute m.”—Jasmine.

Ọ BỤRỤ na ị bụ Onye Kraịst na-eto eto, o nwere ike ịbụ na ụdị ihe a mere Kaleb na Jasmine emetụla gị. O nwere ike ịbụ na eziokwu ndị ị mụtara na Baịbụl na-atọ gị ụtọ otú ọ na-atọ ha, gị achọọkwa ịkọrọ ya ndị ọzọ. Ma o nwere ike mgbe ọ bụla i chetara ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị i kweere, ụjọ abịa gị. Ma i nwere ike ịmụtakwu otú ị ga-esi na-akata obi. Olee otú ị ga-esi mụta ya? Gbalịa mee ihe ndị a:

1. Chọpụta ihe na-atụ gị ụjọ. Mgbe ọ bụla i chetara ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere, ihe mbụ nwere ike ịbata gị n’obi bụ na ndị ọzọ ga-achị gị ọchị! Ma mgbe ụfọdụ, ụjọ ahụ ji gị nwere ike ịkwụsịlata ma ị kọọrọ ya onye ọzọ.

Dezuo ahịrịokwu a:

● M gwa ndị ọzọ n’ụlọ akwụkwọ anyị ihe m kweere, ihe na-atụ m ụjọ nwere ike ime bụ: ․․․․․

Obi nwere ike isi gị ike ma ị ghọta na ndị na-eto eto ibe gị bụ́ Ndị Kraịst na-atụkwa ụdị ụjọ ahụ. Dị ka ihe atụ, otu nwa okorobịa dị afọ iri na anọ aha ya bụ Christopher sịrị, “Ihe na-atụ m ụjọ bụ na ụmụaka ibe m ga-achị m ọchị ma gwa ndị ọzọ na àgwà m dị iche.” Kaleb ahụ e dere ihe o kwuru ná mmalite sịrị, “Ihe tụrụ m ụjọ bụ na mmadụ nwere ike ịjụ m ajụjụ m na-enweghị ike ịza.”

2. Jikere imeri nsogbu ahụ. Ihe ndị ahụ na-atụ gị ụjọ hà bụ ihe na-ekwesịghị ịtụ gị ụjọ? Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ashley chọpụtara na ọ bụchaghị otú ahụ. Ọ sịrị: “Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe m mere ka hà chọrọ ịma ihe m kweere. Ma ha mechara were ihe m gwara ha mawa m njakịrị n’ihu ndị ọzọ.” Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Nicole kọrọ ihe mere ya n’otu oge, sị: “Otu nwa okorobịa gụrụ otu amaokwu Baịbụl na Baịbụl nke ya, gụọkwa ya na Baịbụl nke m, hụ na otú e si dee ya dị iche. O kwuru na Baịbụl nke m dị iche. Ihe ahụ o kwuru enyeghị m ọnụ okwu! Amaghị m ihe m ga-agwa ya.” *

Ihe ndị a nwere ike ime ka ezigbo ụjọ jide onye na-eto eto! Ma kama ịgbara nsogbu ndị ahụ ọsọ, buru n’obi na ha na-abịara Onye Kraịst ọ bụla. (2 Timoti 3:12) Otu nwa okorobịa dị afọ iri na atọ aha ya bụ Matiu sịrị: “Jizọs kwuru na a ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ anya na ihe anyị kweere ga-eme ka ihe anyị masị mmadụ niile.”—Jọn 15:20.

3. Cheta uru ndị ọ ga-abara gị. È nwere ike irite uru n’ihe e chere na ọ bụ nsogbu? Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na otu aha ya bụ Amber chere otú ahụ. Ọ sịrị: “Ọ na-esi ike ịkọwara ndị na-ekweghị na Baịbụl ihe i kweere. Ma ọ ga-enyere gị aka ịghọtakwu ihe i kweere.”—Ndị Rom 12:2.

Laghachigodị n’ihe ahụ i dere nwere ike ime ma ị gwa ụmụ akwụkwọ ibe gị ihe i kweere. Chegodị uru abụọ i nwere ike irite ma ọ dịkarịa ala, deekwa ha n’okpuru ebe a.

1 ․․․․․

2 ․․․․․

Ihe nwere ike inyere gị aka: Olee otú ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere nwere ike isi mee ka ụmụ akwụkwọ ibe gị ghara ịna-enyekarị gị nsogbu ka i mee ihe ọjọọ? Olee otú ọ ga-esi mee ka obi na-esikwu gị ike? Olee otú ọ ga-eme ka obi dị gị n’ebe Jehova nọ? Oleekwa otú obi ga-adị Jehova n’ihi ya?—Ilu 23:15.

4. Jikere ejikere. Ilu 15:28 kwuru, sị: “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche iji zaa okwu.” Ka ị na-eche ihe ị ga-aza ma a jụọ gị ajụjụ, chee echiche ụdị ajụjụ ndị mmadụ nwere ike ịjụ gị. Mee nchọnchọ n’ajụjụ ndị ahụ, cheekwa otú ga-adịrị gị mfe ị ga-esi zaa ha.—Lee anya na chaatị bụ́ “ Kwadebe Ihe Ị Ga-aza,” nke dị na peeji nke 127.

5. Bido ebido. Ọ bụrụ na i jikerela ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere, olee otú i kwesịrị isi malite? E nwere ọtụtụ ụzọ i nwere ike isi malite. Ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere yiri igwu mmiri: Ụfọdụ ndị na-eji nwayọọ abanye ná mmiri; ndị ọzọ na-amaba amaba. I nwere ike ime otú ahụ, buru ụzọ malite ikwu banyere ihe na-agbasaghị Baịbụl ma jirizie nwayọọ webata okwu Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị na ị gaghị emeta ya, o nwere ike ịkara gị mma ‘ịmaba’ n’okwu Baịbụl. (Luk 12:11, 12) Otu nwa okorobịa dị afọ iri na asaa aha ya bụ Andru sịrị: “Iche otú m ga-esi agwa ndị ọzọ ihe m kweere na-esiri m ike karịa ime ya eme. M bidohaala ebido, ọ na-adị mfe karịa otú m chere!” *

6. Mara ihe. Sọlọmọn dere, sị: “Onye amamihe na-eche echiche tupu o mee ihe.” (Ilu 13:16, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Otú ahụ ị na-agaghị amaba ná mmiri na-emighị emi, kpachara anya ka ị ghara ịmaba n’arụmụka na-enweghị isi. Cheta na e nwere oge ikwu okwu na oge ịgbachi nkịtị. (Ekliziastis 3:1, 7) O nwere mgbe Jizọs na-ekweghị aza ajụjụ ndị a jụrụ ya.—Matiu 26:62, 63.

I kpebie ịza ajụjụ a jụrụ gị, gbuo ya nkenke, jirikwa akọ zaa ya. Dị ka ihe atụ, nwa klas unu maa gị njakịrị, sị, ‘Gịnị mere ị naghị aṅụ sịga?’ i nwere ike ịsị ya, ‘Achọghị m ịkpatara onwe m ọrịa!’ I nwere ike iji ihe onye ahụ zara mara ma ị̀ ga-akọwakwuru ya ihe i kweere ka ị̀ ga-agbachi ya nkịtị.

Ihe isii a e kwuru n’isiokwu a nwere ike inyere gị aka ‘ịdị njikere ịzara ọnụ gị’ banyere ihe i kweere. (1 Pita 3:15) N’eziokwu, ịdị njikere apụtaghị na ị gaghị atụ ụjọ mgbe ụfọdụ. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Alana kwuru, sị: “Ị kọwaara ndị ọzọ ihe i kweere n’agbanyeghị na ụjọ ji gị, obi ga-adị gị ụtọ n’ihi na i meriela ụjọ ahụ na-atụ gị na obi abụọ i nwere ma ị̀ ga-emeta ya. I meta ya, obi ga-atọkwu gị ụtọ! Obi ga-adị gị ụtọ na ị katara obi kwuo okwu.”

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ike ụlọ akwụkwọ ọ̀ na-agwụ gị? Chọpụta ihe i nwere ike ime.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 E nwere nsụgharị Baịbụl dị iche iche. Ma, ụfọdụ ndị sụgharịrị Baịbụl sụgharịrị ya otú ọ dị n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ya karịa ndị ọzọ.

^ par. 18 Gụọ igbe bụ́  “Otú E Si Ebido Mkparịta Ụka,” nke dị na peeji nke 124.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Dịrịnụ njikere mgbe niile ịzara ọnụ unu n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ unu ihe mere unu ji nwee olileanya ahụ unu nwere, ma jirinụ obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu na-eme otú ahụ.”—1 Pita 3:15.

NDỤMỌDỤ

Kama ịgwa ụmụ klas unu ihe ha kwesịrị ikwere ma ọ bụ ihe ha na-ekwesịghị ikwere, jiri obi ike gwa ha ihe i kweere na ihe mere i ji chee na ezi uche dị n’ihe i kweere.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ụfọdụ ụmụ klas unu nwere ike ịna-akwanyere gị ùgwù maka na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru, ma ihere nwere ike ịna-eme ha ịjụ gị ihe i kweere.

IHE M GA-EME!

Nwa klas anyị m nwere ike ịgwa ihe m kweere bụ [dee aha otu onye ma ọ dịkarịa ala] ․․․․․

Isiokwu m chere ga-aka amasị ya bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Ọ bụrụ na ụmụ klas unu na-achị gị ọchị n’ihi ihe i kweere, gịnị ka i chere kpatara ya?

● Ọ bụrụ na ị chọrọ ikwu banyere ihe i kweere, gịnị mere ọnụ ji kwesị ịka gị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 126]

“Mgbe m dị obere, achọghị m ịdị iche n’ụmụaka ndị ọzọ. Ma, emechara m ghọta otú okwukwe m si eme ka ndụ m ka mma. Ihe ahụ m ghọtara mere ka obi sikwuo m ike n’ihi na o mere ka ihe m kweere ghara ịna-eme m ihere.”—Jason

[Igbe dị na peeji nke 124]

 Otú E Si Amalite Mkparịta Ụka

“Gịnị ka ị chọrọ ime n’oge ezumike?” [Onye ahụ zachaa, gwa ya ihe ndị gbasara ofufe Chineke ị chọrọ ime, dị ka ịga mgbakọ ma ọ bụ iwepụtakwu oge jee ozi ọma.]

● Kwuo ihe ị nụrụ n’akụkọ ụwa, jụzie ya, sị: “Ị̀ nụrụ ya? Gịnị ka i chere banyere ya?”

“Ì chere na ụkọ ego e nwere n’ụwa taa [ma ọ bụ nsogbu ọzọ] ga-emecha kwụsị? [Chere ka ọ zaa.] Gịnị mere i ji chee otú ahụ?”

“Ò nwere okpukpe ị na-ekpe?”

“Olee ebe i chere ị ga-anọ n’afọ ise na-abịa abịa?” [Ya zachaa, gwa ya ihe gbasara ofufe Chineke ị chọrọ ime.]

[Chaatị dị na peeji nke 127]

 (Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ebe M Dere Ihe

Kwadebe Ihe Ị Ga-aza

Depụta ihe a!

Aro: Gị na ndị mụrụ gị na ụmụnna ndị ọzọ na-eto eto tụlee chaatị a. Dejuo chaatị a. Lezie ma ị̀ ga-echeta ajụjụ ndị ọzọ ụmụ klas unu nwere ike ịjụ gị, cheekwa otú ga-adịrị gị mfe ị ga-esi zaa ha.

Ịnọpụ iche

Ajụjụ

Gịnị mere na ị naghị ekele ọkọlọtọ? Ọ̀ bụ na ị hụghị mba gị n’anya?

Azịza

M na-akwanyere mba anyị ùgwù, ma anaghị m efe ya ofufe.

Ajụjụ Ọzọ

Ọ̀ pụtara na ị gaghị alụrụ mba gị ọgụ?

Azịza

Ee, otú ahụkwa ka ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova nọ ná mba ndị ọzọ na-agaghị alụso mba a ọgụ.

Ọbara

Ajụjụ

Gịnị mere na ị gaghị ekwe ka a mịnye gị ọbara?

Azịza

M ga-ekwe ka a mịnye m ihe ọzọ ga-agwọ m ọrịa, ọ bụghị ihe nwere ike ime ka m bute ọrịa o biri n’ájá ọcha ma ọ bụ ịba ọcha n’anya. Ma Baịbụl gwara anyị ka anyị zere ọbara. N’ihi ya, agaghị m ekwe ka a mịnye m ọbara.

Ajụjụ Ọzọ

Ma ọ́ bụrụkwanụ na ị ga-anwụ ma a mịnyeghị gị ọbara? Chineke ọ́ gaghị agbaghara gị ma i kwe ka a mịnye gị ọbara?

Azịza

․․․․․

Mkpebi gị

Ajụjụ

Onye dị otú a bụ Onyeàmà Jehova, ma o mere ihe dị otú a. Gịnị mere na ị gaghị eme ya?

Azịza

A na-akụziri anyị iwu Chineke, ma a naghị amanye anyị ime ihe a kụziiri anyị! Onye ọ bụla na-eji aka ya ekpebi ihe ọ ga-eme.

Ajụjụ Ọzọ

Ọ̀ pụtara na unu niile anaghị eme otu ihe?

Azịza

․․․․․

Okike

Ajụjụ

Gịnị mere na i kweghị n’evolushọn?

Azịza

Gịnị mere m ga-eji kwere? Ihe ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu banyere ya abụghị otu, ma a sịrị na ọ bụ ha bụ ndị ọkachamara!

Ajụjụ Ọzọ

․․․․․

Azịza

․․․․․

[Foto dị na peeji nke 125]

Ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere yiri igwu mmiri. I nwere ike iji nwayọọ malite ma ọ bụkwanụ maba amaba!