Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

M̀ Kwesịrị Ịkwụsị Ịga Ụlọ Akwụkwọ?

M̀ Kwesịrị Ịkwụsị Ịga Ụlọ Akwụkwọ?

ISI NKE 19

M̀ Kwesịrị Ịkwụsị Ịga Ụlọ Akwụkwọ?

Olee ebe i chere i kwesịrị ịgụru akwụkwọ? ․․․․․

Olee ebe ndị mụrụ gị chọrọ ka ị gụruo? ․․․․․

IHE i dere na ha abụọ ọ̀ bụ otu? Ọ bụrụgodị na ọ bụ otu, ya abụrụkwa na ị ka na-aga ụlọ akwụkwọ, o nwere ike ịdị gị mgbe ụfọdụ ka ị kwụsị. È nwetụla mgbe ọ dị gị otú ọ dị ndị a e dere okwu ha n’okpuru ebe a?

“Mgbe ụfọdụ, ike ụlọ akwụkwọ na-agwụ m nke na ọ naghị adị m ka m si n’ebe m dina bilie. Ihe m na-eche bụ, ‘Oleedị uru ọ baara m ịga ụlọ akwụkwọ na-amụ ihe na-agaghị abara m uru?’”—Rechel.

“O nweela ọtụtụ mgbe ike ụlọ akwụkwọ gwụrụ m nke na ọ dị m ka m kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ ma gaa chọrọ ọrụ. Ọ na-adị m ka o nweghị uru ụlọ akwụkwọ m na-aga na-abara m nakwa na ọ ga-akara m mma imewe ihe ga na-enye m ego.”—Jọn.

“M gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị n’obodo mepere emepe. O sikwaara m ike imeta ndị enyi. Ihe a na-amụ n’ụlọ akwụkwọ esighịrị m ike, ma ndị mmadụ na-agbara m ọsọ, nke mere ka m na-anọkarị naanị m. Ndị ọzọ a kpọrọ asị anaghịdị atụpụrụ m ọnụ! Ọ dị m ka m kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ.”—Ryan.

“E nwere mgbe ihe ndị nkụzi nyere m rụọ n’ụlọ na-ewe m awa anọ n’abalị ọ bụla! Ihe a ga-ede ede na ihe a ga-agụ agụ na ule a ga-ele ekweghị m kuru ume ndụ, nke mere ka m chee na ọ karịala, mụ achọọkwa ịkwụsị.”—Cindy.

“N’ụlọ akwụkwọ anyị, e nwere mgbe anyị gbara ọsọ n’ihi ụjọ bọmbụ. E nweela mmadụ atọ chọrọ igbu onwe ha, nwee onye gburu onwe ya, nweekwa tigbuo zọgbuo ndị òtù ọjọọ kpatara. Mgbe ụfọdụ, o nwere ebe ọ na-eru, mụ achọọ ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ.”—Rose.

Ì nwetụla ụdị nsogbu ndị a? Ọ bụrụ na i nwetụla, gịnị mere i ji chọọ ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ?

․․․․․

O nwere ike, i chesiwela echiche ike ugbu a ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ. Ma olee otú ị ga-esi amata ma ihe mere i ji chọọ ịkwụsị ọ̀ bụ na ị gụruola ebe i kwesịrị ịgụru ka ọ̀ bụ na ike ụlọ akwụkwọ agwụla gị?

Ọ̀ Dị Mma Ka M Kwụsị Ịga Ụlọ Akwụkwọ?

Ị̀ ma na ná mba ụfọdụ, gọọmenti chọrọ ka ndị na-eto eto gụọ akwụkwọ afọ ise ma ọ bụ afọ asatọ ma ọ dịkarịa ala? Ná mba ndị ọzọ, gọọmenti chọrọ ka nwa akwụkwọ ọ bụla gụọ akwụkwọ afọ iri ma ọ dịkarịa ala. N’ihi ya, afọ ole nwa akwụkwọ ga-adị tupu ya agụchaa akwụkwọ ma ọ bụ afọ ole ọ ga-agụru akwụkwọ abụghị otu n’ụwa niile.

Ihe ọzọ bụ na ná mba ụfọdụ, kama nwa akwụkwọ ịgawa ụlọ akwụkwọ, ndị nkụzi nwere ike ịna-aga n’ụlọ ha na-akụziri ya ihe ụfọdụ ma ọ bụ ihe niile a na-amụ n’ụlọ akwụkwọ. Ọ bụrụ na ndị nne na nna ekpebie ka ndị nkụzi na-abịa n’ụlọ akụziri ụmụ ha ihe, a gaghị asị na ụmụaka ahụ akwụsịla ịga ụlọ akwụkwọ.

N’ihi ya, ma ndị nkụzi hà na-akụziri gị ihe n’ụlọ unu ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, ọ bụrụ na ị na-eche echiche ịkwụsị ịgụ akwụkwọ tupu oge ị ga-agụcha eruo, i kwesịrị ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a:

Gịnị ka iwu obodo anyị kwuru? Dị ka anyị kwuru ná mmalite, afọ ole gọọmenti kwuru nwa akwụkwọ ga-agụru akwụkwọ ma ọ́ dịkarịa ala abụghị otu n’obodo niile. Afọ ole ka iwu obodo unu kwuru ka nwa akwụkwọ gụruo akwụkwọ ma ọ́ dịkarịa ala? Ị̀ gụruola ebe ahụ? Ọ bụrụ ị gụrughị ebe ahụ, ọ gaghị adị mma ma ị kwụsị, n’ihi na ọ bụrụ na ị kwụsị, ọ pụtara na ị naghị ‘edo onwe gị n’okpuru ndị ọchịchị’ dị ka Baịbụl kwuru.—Ndị Rom 13:1.

Àmụtala m ihe ndị m chọrọ ịmụta? Olee ihe ndị ị chọrọ ịmụta n’ụlọ akwụkwọ? Ọ bụrụ na ị mabeghị ihe ị chọrọ, i kwesịrị ịchọpụta! Ma ọ́ bụghị ya, ị ga-adị ka onye banyere n’ụgbọ okporo ígwè ma ọ maghị ebe ọ chọrọ ịga. N’ihi ya, gakwuru ndị mụrụ gị ka ha nyere gị aka dejupụta igbe dị na peeji nke 139, nke isiokwu ya bụ,  “Ihe Ndị M Chọrọ Ịmụta n’Ụlọ Akwụkwọ.” Ime otú ahụ ga-enyere gị aka izere ihe ga-emegharị gị anya, nyekwara gị na ndị mụrụ gị aka ikpebi ebe ị ga-agụru.—Ilu 21:5.

O doro anya na ndị nkụzi unu na ndị ọzọ nwere ike ịtụrụ gị aro ebe ị ga-agụru. Ma, ọ bụ ndị mụrụ gị ga-ekpebi ebe ị ga-agụru. (Ilu 1:8; Ndị Kọlọsi 3:20) Ọ gaghị adị mma ka ị kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ ma ọ bụrụ na ị gụrubeghị ebe gị na ndị mụrụ gị kpebiri na ị ga-agụru.

Gịnị mere m ji chọọ ịkwụsị? Kpachara anya ka ị ghara ịghọgbu onwe gị. (Jeremaya 17:9) Ndị mmadụ chọọ ime ihe na-enweghị isi, ha na-achọta ihe ha ga-asị na ọ bụ ya mere ha ji chọọ ime ya.—Jems 1:22.

Dee ezigbo ihe ndị nwere ike ime ka ị kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ n’agụchaghị agụcha.

․․․․․

Dee ihe ndị na-enweghị isi mere i ji chọọ ịkwụsị.

․․․․․

Olee ezigbo ihe ndị i dere? Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ ka i nwee ike kpatawa ego ị ga-eji na-enyere ndị ezinụlọ unu aka ma ọ bụ ka i nyere ndị ọzọ aka ịmata Chineke. Ihe ndị na-enweghị isi nwere ike ịbụ ka ị gbaara ule ọsọ ma ọ bụ ka ị kwụsị ịrụ ihe ndị nkụzi na-enye gị ka ị rụọ n’ụlọ. O nwere ike isiri gị ike ịchọpụta ihe mere i ji chọọ ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ, nakwa ịchọpụta ma ọ̀ bụ ezigbo ihe ka ọ̀ bụ ihe na-enweghị isi.

Lee anya n’ihe ndị ahụ i dere. N’eziokwu gị niile, olee ihe kacha mkpa mere i ji chọọ ịkwụsị? Na nke ahụ kacha mkpa, dee 5. Na nke na-eso ya, dee 4. Derezie ya otú ahụ na-agbada. Ọ bụrụ na ị kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ iji gbaara nsogbu ọsọ, i nwere ike imecha kwaa mmakwaara.

Gịnị Mere na I Kwesịghị Ịkwụsị Ịga Ụlọ Akwụkwọ?

Ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ yiri isi n’ụgbọ okporo ígwè wụpụ mgbe ị na-erubeghị ebe ị na-aga. O nwere ike ịbụ na ahụ́ erughị gị ala n’ime ụgbọ ahụ ma ọ bụ na ndị gị na ha nọ na-akpasu gị iwe. Ma i si n’ụgbọ ahụ wụpụ, ị gaghị eru ebe ị na-aga, i nwekwara ike imerụ ezigbo ahụ́. N’ihi ya, ị kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ, ị gaghị amụta ihe ndị ị chọrọ ịmụta, i nwekwara ike ịkpatara onwe gị ọtụtụ nsogbu ma ugbu a ma n’ọdịnihu. Nsogbu ndị ahụ nwere ike ịbụ:

Nsogbu ndị ị ma na ị ga-enwe: O nwere ike isiri gị ike inweta ọrụ. I nwetagodị ọrụ, o nwere ike ịbụ na ego a ga na-akwụ gị agaghị aha ka nke a gaara na-akwụ gị ma a sị na ị gụchara. Tupu gị enweta ego ị ga-eji na-egbo mkpa gị, i nwere ike ịna-arụ ọrụ ọtụtụ awa n’ebe nwedịrị ike ịka ụlọ akwụkwọ unu njọ.

Nsogbu ndị ị na-amaghị na ị ga-enwe: Nchọpụta e mere gosiri na ọtụtụ ndị kwụsịrị ịga ụlọ akwụkwọ na-arịakarị ọrịa, na-agakarị mkpọrọ. Ha na-achọkarị onye ga-enye ha ihe.

N’eziokwu, ịgụcha akwụkwọ apụtaghị na ị gaghị enwe nsogbu ndị ahụ. Ma, gịnị mere ị ga-eji kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ, bụ́ ihe ga-akpatara gị nsogbu?

Uru Ịgụcha Akwụkwọ Bara

Ị daa ule ma ọ bụ nwee nsogbu n’ụlọ akwụkwọ, o nwere ike ime ka ike akwụkwọ gwụ gị n’ihi na ọ dị gị ka e nweghị nsogbu ị ga-enwe n’ọdịnihu ga-aka nke ị na-enwe ugbu a. Ma tupu i kpebie na ọ kaara gị mma ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ, gụọ uru ụmụ akwụkwọ e dere ihe ha kwuru ná mmalite isiokwu a kwuru ha ritere n’ihi na ha akwụsịghị ịga ụlọ akwụkwọ.

“Amụtala m inwe ndidi na ichebara ihe echiche, mụtakwa na onye chọrọ inwe obi ụtọ n’ihe ọ na-eme kwesịrị ịgbanwe otú o si ele ihe anya. Amụtara m ihe ga-enyere m aka inweta ọrụ n’ihi na akwụsịghị m ịga ụlọ akwụkwọ.”—Rechel.

“Aghọtala m na m gbaa mbọ, m nwere ike ịmụta ihe m chọrọ ịmụta. Ihe m na-amụ n’ụlọ akwụkwọ bụ otú e si arụzi ígwè e ji ebi akwụkwọ, nke ga-enyere m aka inweta ụdị ọrụ m chọrọ ịrụ.”—Jọn.

“Ịgụcha akwụkwọ mere ka m mụta otú e si ede ihe na otú e si agụ ihe. Ụlọ akwụkwọ kụziiri m otú e si erite uru na mba a baara m nakwa otú m ga-esi na-ekwu ihe m bu n’obi ka o doo anya, nke bụ́ ihe na-abara m uru n’ozi ọma.”—Ryan.

“Ụlọ akwụkwọ enyerela m aka ịma ihe m ga-eme ma m nwee nsogbu, ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ebe ọzọ. Ịmụta otú m si emeri nsogbu n’ụlọ akwụkwọ na n’ebe ndị ọzọ enyerela m aka ịna-eme ihe ka onye toro eto.”—Cindy.

“Ụlọ akwụkwọ enyerela m aka ịmụta otú m ga-esi emeri nsogbu ndị m ga-enwe n’ụlọ ọrụ. N’ụlọ akwụkwọ anyị, e nwere ọtụtụ ihe mere ka m chebara ihe m kweere echiche. N’ihi ya, ịnọ n’ụlọ akwụkwọ mere ka okwukwe m sie ike.”—Rose.

Eze Sọlọmọn maara ihe dere, sị: “Njedebe okwu dị mma karịa mmalite ya. Onye nwere ndidi ka onye mmụọ ya dị mpako mma.” (Ekliziastis 7:8) N’ihi ya, kama ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ, jiri ndidi chọpụta otú ị ga-esi merie nsogbu ndị ị na-enwe. I mee otú ahụ, ị ga-achọpụta na ọ ga-aka baara gị uru n’ikpeazụ.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ọ́ bụrụkwanụ na ihe mere ike ụlọ akwụkwọ ji gwụ gị bụ na ihe anaghị adabara gị na onye nkụzi unu?

AMAOKWU BAỊBỤL

“Onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.”—Ilu 21:5.

NDỤMỌDỤ

Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike imeri nsogbu ị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ, jụọ ndị mụrụ gị ihe i nwere ike ime ka ihe dịtụrụ gị mfe, nke ga-eme ka i nwee ike ịgụcha akwụkwọ.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ụmụ akwụkwọ ndị na-anaghị agachi ụlọ akwụkwọ anya na-akwụsịkarị ịga ụlọ akwụkwọ n’agụchaghị agụcha.

IHE M GA-EME!

Ọ bụrụ na ihe a na-akụzi na-esiri m ike, kama ịgbara ya ọsọ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ọ bụrụ na ọ na-adị m ka m kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ n’ihi na ike ya agwụla m, ihe m ga-eme iji die ya bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị mụta ịgụ ihe, ide ihe, na mgbakọ na mwepụ nke ọma?

● I kpebie ihe ị chọrọ ịmụta ugbu a n’ụlọ akwụkwọ, olee otú ọ ga-esi nyere gị aka iji oge ị nọ n’ụlọ akwụkwọ na-eme ihe bara uru?

● Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị matatụ ugbu a banyere ọrụ ị chọrọ ịrụ mgbe ị gụchara akwụkwọ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 140]

“Ị gaghị agbanahụ nsogbu niile. Ịga ụlọ akwụkwọ ga-enyere gị aka ịmụta otú ị ga-esi na-eme ihe i kpebiri ime, nke bụ́ ihe ga-abara gị uru n’ụlọ ọrụ nakwa n’ebe ndị ọzọ.”—Ramona

[Igbe dị na peeji nke 139]

Ebe M Dere Ihe

Ihe Ndị M Chọrọ Ịmụta n’Ụlọ Akwụkwọ

  Ihe kacha mkpa mere mmadụ ji aga ụlọ akwụkwọ bụ ka ọ mụta ihe ga-enyere ya aka inweta ọrụ ọ ga-eji na-egbo mkpa ya na nke ezinụlọ o nwere ike inwe. (2 Ndị Tesalonaịka 3:10, 12) Ì kpebiela ụdị ọrụ ị chọrọ ịrụ na otú ihe ị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ ga-esi nyere gị aka ịmụta ya? Zaa ajụjụ ndị a, ka ha nyere gị aka ịmata ma ihe ị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ ọ̀ ga-eme ka ị mụta ihe ị chọrọ ịmụta:

Gịnị ka m ma eme? (Dị ka ihe atụ, gị na ndị mmadụ ùnu na-adị ná mma? Ọrụ aka ò doro gị anya? E nwee nsogbu, ị̀ ma otú e si achọpụta ihe kpatara ya nakwa otú e si emeri ya?) ․․․․․

Olee ụdị ọrụ m ga-eji ihe m mụtara rụọ? ․․․․․

Olee ụdị ọrụ m nwere ike inweta n’ebe m bi? ․․․․․

Gịnị ka m na-amụ ugbu a ga-enyere m aka inweta ọrụ? ․․․․․

Olee ihe ndị a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ m kwesịrị ịmụ ugbu a ga-enyere m aka ịrụ ụdị ọrụ m chọrọ ịrụ? ․․․․․

Cheta na ihe mere i ji aga ụlọ akwụkwọ bụ ka ị mụta ihe ga-abara gị uru. N’ihi ya, abụla nwa akwụkwọ na-anaghị agụcha agụcha, nke chọrọ ịgbara ihe onye toro eto kwesịrị ịrụ ọsọ. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 67 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 38 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2.

[Foto dị na peeji nke 138, 139]

Ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ yiri isi n’ụgbọ okporo ígwè wụpụ mgbe ị na-erubeghị ebe ị na-aga