Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ụmụ Okorobịa Ji Agbara M Ọsọ?

Gịnị Mere Ụmụ Okorobịa Ji Agbara M Ọsọ?

ISI NKE 27

Gịnị Mere Ụmụ Okorobịa Ji Agbara M Ọsọ?

Ọ ma na m bụ onye a ma ama, n’ihi na agwala m ya na ụmụ okorobịa ndị ọzọ na-anwụrụ m. Ọ chịrị ọchị mgbe m gwara ya na ụfọdụ ndị enyi m na-eme iberiibe. Ọ makwa na m ma ihe, n’ihi na o nweela ihe ụfọdụ ọ na-ekwuteghị, mụ agbazie ya olu. Amaghị m ihe mere na ọ chọbeghị ịgwa m ka mụ na ya kpawa.

Nwa agbọghọ ahụ mara mma, ma ọ maghị ihe! Ọ naghị ekwe m kwuo okwu. M kwuo ekwuo, ya asị na mụ ekwuteghị ya! Achọghịzi m iji anya ahụ ya.

Ọ̀ NA-EWUTE gị na ụmụ okorobịa na-agbara gị ọsọ? Ọ na-ewute ọtụtụ ụmụ agbọghọ, ma ndị nke i chere na ụmụ nwoke ga na-anwụrụ! Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Joan mara mma, mara ihe, okwu na-agakwa ya were were n’ọnụ. Ma, ọ sịrị: “Ọ na-adịkarị m ka ụmụ okorobịa hà na-agbara m ọsọ. Ụfọdụ n’ime ha mụ na ha dịwara ná mma mechara kwụsịchaa ịtụpụrụ m ọnụ!”

Olee ihe ndị ga-eme ka ihe nwa agbọghọ masịwa ụmụ okorobịa? Gịnị ga-eme ka ihe ya ghara ịna-amasị ha? Gịnị ka ị ga-eme ka ihe gị masịwa nwa okorobịa bụ́ ezigbo mmadụ?

Ihe I Kwesịrị Ime

Mara uche gị na obi gị. O nwere ike ịbụ na ihe gbasara ụmụ nwoke masịwara gị mgbe ị na-etopụta agbọghọ. N’oge ahụ, o nwekwara ike ọ bụghị naanị otu nwa okorobịa ka ihe ya masịrị gị. Ọ bụghị ihe ọjọọ. Ma, a sị na ị malitere ịnwụrụ nwa okorobịa mbụ ihe ya masịrị gị, ọ gaara eme ka ị ghara ịmụta otú e si eche echiche ka onye toro eto, meekwa ka ị ghara inwecha ọganihu n’ozi Chineke. Ọtụtụ afọ ga-agafe tupu mmadụ amụta ịkpa àgwà ọma, ‘gbanwee uche ya’ n’ihe ndị dị mkpa, meekwa ụfọdụ ihe kpebiri ime.—Ndị Rom 12:2; 1 Ndị Kọrịnt 7:36; Ndị Kọlọsi 3:9, 10.

N’eziokwu, ọtụtụ ụmụ okorobịa na-achọ ụmụ agbọghọ ndị na-amabeghị ihe ha ga-eji ndụ ha mee ma ọ bụ ndị na-ekweta ihe ọ bụla a gwara ha. Ma, ihe dị ụdị ụmụ okorobịa ahụ mkpa bụ mma ụmụ agbọghọ ahụ mara, ọ bụghị àgwà ha. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ezigbo nwa okorobịa ga-achọ nwa agbọghọ nwere àgwà ọma ndị ga-enyere yanwa aka.—Matiu 19:6.

Ihe ụmụ okorobịa kwuru: “Nwa agbọghọ ihe ya na-amasị m bụ onye nwere ike ikpebi ihe ọ ga-eme nakwa onye a na-anaghị akwagharị akwagharị.”—Jems.

“Nwa agbọghọ ihe ya na-amasị m bụ onye na-agwa m eziokwu ma na-akwanyere m ùgwù, ọ bụghị onye na-ekweta ihe ọ bụla m kwuru. Ọ bụrụgodị nwa agbọghọ mara mma, obi agaghị adị mụ mma ma ọ bụrụ na ọ na-agwa m naanị ihe m chọrọ ịnụ.”—Darren.

Gịnị ka i chere banyere ihe ụmụ okorobịa ahụ kwuru?

․․․․․

Mụta ịsọpụrụ ndị ọzọ. Otú ahụ ị chọrọ ka a hụ gị n’anya ka ụmụ okorobịa chọsikwara ike ka a na-akwanyere ha ùgwù. Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji kwuo na di kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya, ma kwuo na nwunye kwesịrị ‘ịkwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.’ (Ndị Efesọs 5:33) Ajụjụ ọnụ a gbara ọtụtụ ụmụ nwoke gosiri na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. E kee ndị bụ́ ụmụ okorobịa n’ime ha ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ isii kwuru na ha chọrọ ka a na-akwanyere ha ùgwù karịa ịhụ ha n’anya. E keekwa ụmụ nwoke katarala ahụ́ ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ asaa kwukwara otu ihe ahụ.

Ịkwanyere nwa okorobịa ùgwù apụtaghị na ị ga na-ekweta ihe ọ bụla o kwuru ma ọ bụ na ị gaghị ekwu ihe i chere. (Jenesis 21:10-12) Ma otú i si kwuo ya nwere ike ime ka ihe gị masị ya ma ọ bụ ka ọ gbawara gị ọsọ. Ọ bụrụ na ị na-arụ ya ụka ma ọ bụ na-agbazi ya olu mgbe niile, o nwere ike iche na ị naghị akwanyechara ya ùgwù. Ma, ị ghọta ihe o kwuru, jaakwa ya mma n’ihe ndị dị mma o kwuru, o nwere ike ikweta ihe ị na-agwa ya, jirikwa ya kpọrọ ihe. Nwa okorobịa nke maara ihe ga-achọpụtakwa ma ị̀ na-akwanyere ndị ezinụlọ unu na ndị ọzọ ùgwù.

Ihe ụmụ okorobịa kwuru: “Ọ dị m ka ihe kacha mkpa ma nwoke na nwaanyị malite ịkpa bụ ịkwanyere ibe ha ùgwù. Ha nwere ike ịhụwa ibe ha n’anya ka oge na-aga.”—Adrian.

“Ama m na nwa agbọghọ na-akwanyere m ùgwù ga-ahụ m n’anya.”—Mak.

Gịnị ka i chere banyere ihe ụmụ okorobịa ahụ kwuru?

․․․․․

Na-eji ejiji dị mma, na-adịkwa ọcha. Uwe gị na ejiji gị yiri ígwè okwu i ji agwa ndị mmadụ otú i si eche echiche na otú i si akpa àgwà. Tupu ị malite ịgwa nwa okorobịa okwu, ejiji gị agwala ya ọtụtụ ihe banyere gị. I jie ejiji dị mma, ọ ga-agwa ya ihe dị mma banyere gị. (1 Timoti 2:9) I jie ejiji ka ndị akwụna, ọ ga-eme ka o lewe gị anya ọjọọ!

Ihe ụmụ okorobịa kwuru: “Ejiji nwa agbọghọ na-ekwu ọtụtụ ihe banyere ụdị ndụ ọ na-ebi. Ọ bụrụ na ọ na-eji ejiji ka ndị akwụna, m ga-aghọta na ọ chọrọ ka ụmụ nwoke chụwa ya.”—Adrian.

“O nweghị ihe na-atọ m ka nwa agbọghọ nwere olu ọma, onye na-elebara onwe ya na ntutu isi ya anya nke ọma. E nwedịrị nwa agbọghọ mara mma ihe ya masịrị m. Ma ihe ya gbụrụ m ozugbo m chọpụtara na ọ na-eru unyi.”—Ryan.

“Nwa agbọghọ jie ejiji ka ndị akwụna, o nwere ike ime ka ụmụ nwoke lewe ya. Ma ọ bụghị ụdị onye ahụ ka m chọrọ ka mụ na ya na-akpa.”—Nicholas.

Gịnị ka i chere banyere ihe ụmụ okorobịa ahụ kwuru?

․․․․․

Ihe Ị Na-ekwesịghị Ime

Achụla nwoke. Ụmụ nwaanyị na-akpa ike dị egwu n’ahụ́ ụmụ nwoke. Ha nwere ike iji ike ahụ ha nwere mee ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. (Jenesis 29:17, 18; Ilu 7:6-23) Ọ bụrụ na ị na-agbalị ka ihe gị masị nwa okorobịa ọ bụla ị hụrụ, e nwere ike ịna-ele gị anya ka onye na-achụ nwoke.

Ihe ụmụ okorobịa kwuru: “Naanị ịnọkete nwa agbọghọ mara mma ma na-emetụ ya ahụ́ na-atọ ụtọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na nwa agbọghọ na-emetụkarị m aka mgbe ọ na-agwa m okwu, m ga-ewere ya na ọ na-achụ nwoke.”—Nicholas.

“Ọ bụrụ na nwa agbọghọ na-emetụkarị nwa okorobịa ọ bụla ọ hụrụ aka ma ọ bụ na-egburu nke ọ bụla gaferenụ iku anya, ana m ewere ya na ọ na-achụ nwoke. Ụdị ihe ahụ anaghị adị mụ mma.”—José.

Achọla ka ọ na-eche naanị banyere gị. Nwoke na nwaanyị lụọ, ha na-aghọ “otu anụ ahụ́” dị ka Baịbụl kwuru. (Jenesis 2:24) Mgbe ahụ ha bụ di na nwunye, ha na-ahapụ ọtụtụ ihe ha na-emebu mgbe ha na-alụbeghị; obi ha na-adịzi n’ebe ibe ha nọ. (1 Ndị Kọrịnt 7:32-34) Ma, ọ bụrụ na gị na nwa okorobịa ka malitere ịkpa, i kwesịghị ịchọ ka ọ na-agwa gị ihe ọ bụla ọ na-eme. O kwesịghị ịchọ ka gịnwa na-eme otú ahụ. * N’eziokwu, ị ghọta na ya na ndị enyi ya ndị ọzọ kwesịrị ịna-anọrị, o nwere ike ime ka ihe gị masịkwuo ya. Otú ya na ha si akpa ga-eme ka ị mata ụdị onye ọ bụ.—Ilu 20:11.

Ihe ụmụ okorobịa kwuru: “Ọ bụrụ na nwa agbọghọ na-achọ ịma ihe ọ bụla m na-eme, na-achọkwa ka mụ na ya na-anọ mgbe niile, ma ghara ịna-akpa ndị ọzọ nso, ọ ga-adị m ka ọ naghị ekwe m kuru ume.”—Darren.

“Ọ bụrụ na nwa agbọghọ m ka matara amata na-ezitere m ozi n’ekwe ntị mgbe niile, na-achọ ịma onye mụ na ya nọ, nke ka nke, aha ụmụ agbọghọ mụ na ha nọ, ọ na-egosi na nsogbu dị.”—Ryan.

“Ọ bụrụ na nwa agbọghọ anaghị ekwe ka mụ na ndị enyi m bụ́ ụmụ nwoke nọrịa, ma ọ bụ na-ewe iwe ma ọ bụrụ na mụ na ya anọghị, m ga-ewere ya na ọ na-enye m nsogbu.”—Adrian.

Gịnị ka i chere banyere ihe ụmụ okorobịa ahụ kwuru n’isiokwu nta a?

․․․․․

Ghọta na Ị Bara Uru

I nwere ike ịma ụmụ agbọghọ ndị ga-eme ihe ọ bụla ka nwa okorobịa hụ ha ma lewe ha anya ọma. Ụfọdụ nwere ike ime ihe ha ma na ọ dịghị mma, naanị ka ha nweta enyi nwoke ma ọ bụ lụọ di. Ma, ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ na ‘mmadụ ga-aghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ,’ gbasara ihe a a na-ekwu. (Ndị Galeshia 6:7-9) Ọ bụrụ na ị ghọtaghị na ị bara uru, ọ bụrụkwa na ị naghị eme ihe ị ma ziri ezi, ụmụ okorobịa ihe gị ga-amasị nwere ike ịbụ ndị na-ejighị gị ma ọ bụ ihe i kweere kpọrọ ihe.

N’eziokwu, ọ bụghị ụmụ okorobịa niile ka ihe gị ga-amasị. Ọ dịkwa mma otú ahụ. Ma ọ bụrụ na ị na-elebara onwe gị anya, na-akpakwa àgwà ọma, ị ‘ga-aba uru nke ukwuu n’anya Chineke,’ ihe gị ga-amasịkwa nwa okorobịa bụ́ ezigbo mmadụ.—1 Pita 3:4.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ọ́ bụrụkwanụ na ị bụ nwa okorobịa, ma na-eche, sị: ‘Gịnị mere ụmụ agbọghọ ji agbara m ọsọ?’

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 30 Nwoke na nwaanyị kwekọrịta na ha ga-alụ, onye nke ọ bụla kwesịrị ịna-agwa ibe ya ihe ọ na-eme.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Ịma mma pụrụ ịbụ ụgha, mma elu ahụ́ pụkwara ịbụ ihe efu; ma nwaanyị nke na-atụ egwu Jehova na-enwetara onwe ya otuto.”—Ilu 31:30.

NDỤMỌDỤ

Etechala oké ntecha! Itecha oké ntecha nwere ike ime ka ụmụ nwoke chewe na ị na-ebuli onwe gị elu ma ọ bụ na ị chọrọ ka ha hụ gị.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka nwa okorobịa chewe naanị banyere gị mgbe niile, o nwere ike ime ka ọ gbawara gị ọsọ.

IHE M GA-EME!

Àgwà m ga-agbalịsi ike na-emekwu nke ọma na ya bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Olee otú ị ga-esi gosi na ị naghị eji ihe nwa okorobịa chere na otú obi dị ya egwuri egwu?

● Olee otú ị ga-esi gosi na ị ghọtara na ị bara uru?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 190]

“M hụhaala nwa agbọghọ mara mma, ihe ya na-amasị m. Ma, ihe ya na-agbụ m ma m chọpụta na o nweghị ezigbo ihe o kpebiri iji ndụ ya mee. Ma ọ bụrụ na o nwere ihe bara uru ọ chọrọ iji ndụ ya mee, ya abụrụkwa na o meela ụfọdụ n’ime ha, ọ ga-eme ka ihe ya masịkwuo m.”—Damien

[Foto dị na peeji nke 191]

Ịhụnanya na nkwanye ùgwù yiri wiil abụọ na-adị n’ígwè, ha abụọ dịcha mkpa