Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye M Ga-eṅomi—Job

Onye M Ga-eṅomi—Job

Onye M Ga-eṅomi​—Job

Nsogbu si n’elu si n’ala zuo Job ahụ́. Nke mbụ bụ na ihe niile o ji akpata ego lara n’iyi. Nke abụọ bụ na ụmụ ya nwụrụ. Nke atọ abụrụ na ọrịa bịara ya. Ihe a niile mere n’egbughị oge, mgbe ọ na-atụghịkwa anya ya. Job chị obi n’aka kwuo, sị: “Mkpụrụ obi m akpọwo ndụ m asị.” O kwukwara na ‘ihere na nhụsianya zuru ya ahụ́.’ (Job 10:1, 15) Ma, n’agbanyeghị nsogbu ahụ niile, Job ekweghị agbakụta Onye kere ya azụ. (Job 2:10) Ihe ndị gbanwere ná ndụ ya emeghị ka àgwà ya gbanwee. N’ihi ya, Job bụ onye tachiri obi anyị kwesịrị iṅomi.

Ọ bụrụ na nsogbu abịara gị, i nwekwara ike ‘ịkpọ ndụ gị asị.’ Ma, dị ka Job, i nwere ike igosi na ị gaghị ekwe ka nsogbu ahụ gbanwee àgwà gị nakwa na i kpebisiri ike ịna-ejere Jehova Chineke ozi. Jems dere, sị: “Lee! Anyị na-akpọ ndị tachiri obi ndị obi ụtọ. Unu anụwo banyere ntachi obi Job, unu ahụwokwa ihe Jehova mesịrị mee, na Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu, na-emekwa ebere.” (Jems 5:11) Ihe banyere Job metụrụ Jehova n’obi, ihe banyere gị na-emetụkwa ya n’obi!