Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye M Ga-eṅomi—Rut

Onye M Ga-eṅomi—Rut

Onye M Ga-eṅomi​—Rut

Rut bụ nwaanyị di ya nwụrụ nke ji obi ya niile soro nne di ya. O kpebiri iso Neomi bụ́ nne di ya merela agadi kama ịlawa obodo ha bụ́ ebe ihe nwere ike ịkara ya mma. Ọ bụ ezie na ihe ahụ Rut kpebiri ime nwere ike ime ka ọ ghara ịhụ onye ga-alụ ya, o cheghị naanị banyere onwe ya. Otú o si hụ Neomi n’anya, chọọkwa iso ndị Jehova dị ya mkpa karịa ịchọwa onye ga-alụ ya.—Rut 1:8-17.

Ì chewela echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Ọ bụrụ otú ahụ, ṅomie Rut. Kama ichewe naanị otú ọ dị gị n’obi, chọpụta ma è nwere àgwà ọma ndị i kwesịrị ịmụta ugbu a nke ga-abara onye ị ga-alụ uru. Dị ka ihe atụ, ị̀ na-akwụsi ike n’ihe i kpebiri ime ma na-enyere ndị ọzọ aka? Ị̀ na-eme ihe Chineke kwuru, ọ bụrụgodị na anụ ahụ́ gị na-ezughị okè chọrọ ka ị ghara ime ya? Rut achọghị di ọnwụ ọnwụ. Ma o mechara nweta di nke bụ́ nwoke tozuru okè, onye nwere ụdị àgwà ọma ndị yanwa nwere. Nwoke ahụ hụkwara Chineke n’anya. I nwekwara ike inweta ụdị onye ahụ.